Publicidade

Salmos 56

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Ọ bụ olu abụ "Nduru nọ nʼosisi Ook dị ebe dị anya." Abụ nke Devid ka eji agụ ya. Abụ miktam. Mgbe ndị Filistia nọchibidoro ya nʼobodo Gat.
Ekpere maka mgbapụta

1 O Chineke, meere m ebere,

nʼihi na ndị mmadụ ji ike na-achụso m;

ogologo ụbọchị niile, ha na-ebu agha imegide m.

2 Ogologo ụbọchị niile ndị iro m na-achụso m;

site na nganga ha, ọtụtụ na-ebu agha megide m.

3 Ma mgbe ụjọ na-atụ m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m.

4 Nʼime Chineke onye m na-eto okwu ya,

nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m.

Gịnị ka mmadụ efu pụrụ ime m?

5 Ogologo ụbọchị niile, ha na-asụgharị okwu m kwuru isi;

oge niile ka ha na-atụ atụmatụ imerụ m ahụ.

6 Ha na-agba izu nzuzo na-ezokwa onwe ha,

ha na-enyochapụta nzọ ụkwụ m niile,

dịkwa njikere ịnapụ m ndụ m.

7 Nʼihi ajọ omume ha, ekwekwala ka ha gbapụ;

o Chineke, nʼime iwe gị, wedaa mba ndị a niile dị iche iche nʼala.

8 Depụta akwa arịrị m;

chekọtasịa anya mmiri akwa m niile nʼime karama gị.

Ọ bụ na ha adịghị nʼakwụkwọ ndepụta gị?

9 Mgbe m ga-akpọku gị maka enyemaka,

ndị iro m ga-agbaghachi azụ.

Site nʼụzọ dị otu a, aga m amara na Chineke nọnyeere m.

10 Nʼime Chineke, onye m na-eto okwu ya,

nʼime Onyenwe anyị, onye m na-eto okwu ya,

11 nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m.

Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?

12 O Chineke m, nʼisi m ka nkwa niile m kwere gị dị;

aga m ewetara gị onyinye ekele m niile.

13 Nʼihi na ị zọpụtala m site nʼọnwụ,

ma napụta ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ,

ka m nwee ike jegharịa nʼihu Chineke,

nʼìhè nke ndụ.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-