Publicidade

Salmos 126

Abụ nrigo.
Abụ ekele maka mgbapụta

1 Mgbe Onyenwe anyị kpọghachitere ndị e mere ka ha lọta na Zayọn,

anyị dị ka ndị na-arọ nrọ.

2 Ọchị juru anyị ọnụ,

abụ ọṅụ jukwara anyị ire.

Mgbe ahụ, e kwukwara ya na mba niile sị,

"Onyenwe anyị emeerela ha ọtụtụ ihe dị ukwuu."

3 Onyenwe anyị emeerala anyị ọtụtụ ihe dị ukwuu,

obi anyị jupụtakwara nʼọṅụ.

4 Nyeghachi anyị akụnụba anyị, o Onyenwe anyị,

dịka mmiri iyi na-asọ nʼala Negev.

5 Ndị niile na-eji anya mmiri na-arụ ọrụ ịkụ mkpụrụ

ga-emesịa jiri abụ ọṅụ wee ihe ubi ahụ.

6 Onye ji ịkwa akwa

buru mkpụrụ ubi ọ ga-agha na-aga,

ga-emesịa jiri abụ ọṅụ na-alọghachi azụ,

mgbe ha bu ukwu ọka ha.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-