Publicidade

Salmos 12

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro Sheminit. Abụ Ọma nke Devid.
Ekpere maka enyemaka nʼoge ihe egwu

1 Onyenwe anyị, nyere anyị aka! Nʼihi na ndị ezi omume agwụla!

Ndị kwesiri ntụkwasị obi anọkwaghị nʼetiti ụmụ mmadụ.

2 O nwekwaghị onye eziokwu dị nʼọnụ ya nye onye agbataobi ya.

Egbugbere ọnụ onye ọbụla na-ekwukwa okwu ire ụtọ,

maọbụ aghụghọ dị nʼobi ha.

3 Ka Onyenwe anyị wezuga egbugbere ọnụ niile na-ekwu okwu ire ụtọ

na ire niile na-ekwu okwu ịnya isi.

4 Ndị na-asị,

"Ọ bụ site nʼire anyị ka anyị ga-enwe mmeri;

egbugbere ọnụ anyị ga-echebe anyị, ọ bụ onye na-achị anyị?"

5 "Nʼihi na a na-apụnara ndị ogbenye ihe nʼihi ndị nọ na mkpa na-asụ ude,

aga m ebili ugbu a, ka Onyenwe anyị kwuru.

Aga m zọpụta ha pụọ nʼaka ndị ahụ ji iwe ekwulu ha."

6 Okwu ọnụ Onyenwe anyị niile zuruoke,

ha dịka ọlaọcha a nụchara nʼọkụ,

nke a nụchara ugboro asaa.

7 O Onyenwe anyị, i ga-edebe anyị nʼudo

ma sitekwa nʼaka ndị dị otu a chebe anyị ruo mgbe ebighị ebi.

8 Ndị ajọ omume na-ejegharị nʼebe niile

mgbe a na-eto ihe ọjọọ nʼetiti ụmụ mmadụ.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-