Publicidade

Salmos 13

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid.
Ekpere maka nnapụta

1 Ruo ole mgbe ka i ga-echefu m Onyenwe anyị?

Ruo ole mgbe ka i ga-ezonarị m ihu gị?

2 Ruo ole mgbe ka mụ na mmụọ m ga na-agba mgba

nọdụkwa na-eru ụjụ kwa ụbọchị nʼime mkpụrụobi m?

Ruo ole mgbe ka ndị iro m ga-anọgide na-emeri m?

3 Lekwasị m anya, ma zaa m, O Onyenwe anyị Chineke m.

Nyeghachi m ìhè nke anya m ka m ghara ịnwụ;

4 mgbe ahụ onye iro m ga-asị, "Emeriela m ya,"

mgbe m ga-ada, ndị kpọrọ m asị ga-aṅụrịkwa ọṅụ.

5 Ma atụkwasịrị m obi nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ;

mkpụrụobi m na-aṅụrị ọṅụ na nzọpụta gị.

6 Aga m abụku Onyenwe anyị abụ,

nʼihi na o mesoro m mmeso ọma.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-