Publicidade

Salmos 150

Ka ihe niile too Onyenwe anyị

1 Toonu Onyenwe anyị.

Toonu Chineke nʼime ụlọnsọ ya.

Toonu ya, na mbara igwe nke ike ya.

2 Toonu ya, nʼihi ọrụ niile ọ rụrụ site nʼike ya.

Toonu ya, nʼihi ịdị ukwuu ya nke kachasị ịdị ukwuu niile.

3 Werenụ opi ike too ya,

werekwanụ ụbọ akwara na une too ya,

4 jirinụ ihe iti egwu na ite egwu too ya,

jirikwanụ ụbọ akwara dị iche iche na ọja too ya,

5 werenụ ogene too ya,

werekwanụ ogene na-ada oke ụda too ya.

6 Ka ihe niile na-eku ume too Onyenwe anyị.

Toonu Onyenwe anyị.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-