Pular para o conteúdo
Publicidade

Abụ Ọma 150

Ka ihe niile too Onyenwe anyị

1 Toonu Onyenwe anyị.

Toonu Chineke nʼime ụlọnsọ ya.

Toonu ya, na mbara igwe nke ike ya.

2 Toonu ya, nʼihi ọrụ niile rụrụ site nʼike ya.

Toonu ya, nʼihi ịdị ukwuu ya nke kachasị ịdị ukwuu niile.

3 Werenụ opi ike too ya,

werekwanụ ụbọ akwara na une too ya,

4 jirinụ ihe iti egwu na ite egwu too ya,

jirikwanụ ụbọ akwara dị iche iche na ọja too ya,

5 werenụ ogene too ya,

werekwanụ ogene na-ada oke ụda too ya.

6 Ka ihe niile na-eku ume too Onyenwe anyị.

Toonu Onyenwe anyị.150:6 Mgbe mmadụ na-eti, Toonu Onyenwe anyị, ya na onye na-eti Haleluya, na-ekwu otu ihe ahụ.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também