Publicidade

Salmos 144

Abụ Ọma nke Devid.
Abụ nke dike nʼagha

1 Otuto dịrị Onyenwe anyị, onye bụ oke nkume m,

onye na-ezi aka m abụọ ibu agha,

na mkpịsịaka m ịlụ ọgụ.

2 Ọ bụ Chineke m, onye jupụtara nʼịhụnanya, bụrụkwa ebe mgbaba m e wusiri ike,

ebe m e wusiri ike na onye mgbapụta m,

ọ bụ ọta m, onye m na-agbaba nʼime ya,

onye ji aka ike mee ka ndị dị iche iche nọdụ nʼokpuru m.

3 O Onyenwe anyị, gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche echiche banyere ya,

gịnị ka nwa nke mmadụ bụ ihe banyere ya ji na-emetụ gị nʼobi?

4 Mmadụ dị ka otu nkuume;

ụbọchị ndụ ya niile na-agafe ngwangwa dịka onyinyo.

5 O Onyenwe anyị, kewaa eluigwe rịdata;

metụ ugwu niile aka ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ.

6 Zipụ amụma ka o chụsasịa ndị iro niile;

gbaa ha àkụ gị niile ma chụsasịa ha.

7 Site nʼelu setịpụ aka gị;

gbapụta m, napụtakwa m

site nʼoke osimiri,

site nʼaka ndị si mba ọzọ,

8 ndị ọnụ ha jupụtara nʼụgha,

ndị aka nri ha jupụtakwara nʼaghụghọ.

9 O Chineke, aga m abụku gị abụ ọhụrụ.

Une e ji akwara iri mee ka m ga-eji kpọọrọ gị egwu;

10 gị onye na-enye ndị eze mmeri,

onye na-agbapụta ohu ya Devid.

Site na mma agha dị njọ 11 gbapụta m;

napụtakwa m site nʼaka ndị si mba ọzọ

ndị ọnụ ha jupụtara nʼụgha,

ndị aka nri ha jupụtakwara nʼaghụghọ.

12 Mgbe ahụ, ụmụ ndị ikom anyị, nʼoge okorobịa ha,

ga-adị ka ihe a kụrụ nʼala e lekọtara anya nke ọma,

ụmụ anyị ndị inyom ga-adị ka ogidi a pịrị apị

e ji achọ ụlọeze mma.

13 Ọba anyị niile ga-ejupụta nʼihe oriri

dị iche iche si nʼubi anyị.

Atụrụ anyị ga-amụba nʼọtụtụ puku nʼọnụọgụgụ,

ha ga-adị iri puku kwụrụ puku nʼubi anyị;

14 igwe ehi anyị ga-adọkpụ ibu dị arọ.

A gaghị enwe ntipu na mgbidi anyị niile,

a gaghị adọta anyị nʼagha gaa obodo ọzọ,

akwa ihe mgbu agaghị adị nʼokporoụzọ anyị niile.

15 Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ, ndị ihe ndị a dịịrị;

ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ, ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-