Publicidade

Salmos 128

Abụ nrigo.
Ngọzị dịrị ndị na-atụ egwu Onyenwe anyị

1 Ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị,

ndị na-aga ije nʼirube isi nye ya.

2 Ị ga-eri mkpụrụ ọrụ aka gị;

ọtụtụ ngọzị na ihe ịga nke ọma ga-abụ nke gị.

3 Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị

na-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị;

ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi oliv

gburugburu tebul gị.

4 Otu a ka a ga-esi gọzie nwoke ahụ

na-atụ egwu Onyenwe anyị.

5 Ka Onyenwe anyị gọzie gị site na Zayọn

ụbọchị niile nke ndụ gị;

ka i hụkwa ọdịmma Jerusalem,

6 ka ị dị ndụ hụ ụmụ ụmụ gị.

Ka udo dịrị Izrel.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-