Publicidade

Salmos 43

Arịrịọ maka enyemaka

1 O Chineke, kpepụta m,

kpechitere m ikpe m

nʼebe mba na-amaghị Chineke nọ;

gbapụta m site nʼaka

ndị ajọ omume na ndị aghụghọ.

2 Ị bụ Chineke, ebe m e wusiri ike.

Gịnị mere i ji jụ m?

Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụ,

nʼihi mmegbu nke onye iro?

3 Zipụ ìhè gị na eziokwu gị,

ka ha duo m;

ka ha kpọbata m nʼugwu nsọ gị,

bụ ebe i bi.

4 Mgbe ahụ, aga m aga nʼebe ịchụ aja Chineke,

gakwuru Chineke, bụ ọṅụ m na obi ụtọ m.

Aga m eji ụbọ akwara too gị,

O Chineke, bụ Chineke m.

5 O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba?

Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m?

Nwee olileanya na Chineke,

nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ,

onye Nzọpụta m na Chineke m.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-