Publicidade

Salmos 81

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ nke Asaf nʼusoro gittit.
Ịdị mma nke Chineke

1 Bụkuo Chineke bụ ike anyị abụ ọṅụ,

tikusie Chineke Jekọb mkpu ike!

2 Bidonụ iti egwu, kụọ ihe iti egwu,

kpọọnụ ụbọ akwara na-enye abụ ụtọ na une.

3 Fụọnụ opi ike nʼoge ọnwa ọhụrụ,

na mgbe ọnwa gbapụtara nʼuju ya, nʼụbọchị mmemme anyị;

4 nke a bụ iwu dịrị Izrel,

ụkpụrụ Chineke nke Jekọb.

5 O mere ka o guzosie ike dịka iwu nye Josef

mgbe ọ pụrụ imegide Ijipt.

Anụkwara m olu nʼasụsụ nke m na-amaghị, ka ọ na-asị:

6 "Ewezugala m ibu arọ site nʼubu ha;

aka ha abụọ nwere onwe ha site nʼịrụ ọrụ.

7 Nʼime ihe mgbu unu, unu kpọrọ oku, anapụtara m unu,

azara m unu site nʼegbe eluigwe;

anwara m unu na mmiri nke Meriba. Sela

8 "Nụrụnụ, ndị m, aga m adọ unu aka na ntị,

a sịkwarị na unu ga-ege m ntị, unu ndị Izrel!

9 Unu agaghị enwe chi ndị mba ọzọ nʼetiti unu;

unu agaghị akpọkwa isiala nye chi si ala ọzọ.

10 Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu,

onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt.

Meghe ọnụ unu ka ọ saa mbara, aga m emeju ya.

11 "Ma ndị m ekweghị ige m ntị.

Izrel emekwaghị dịka m gwara ha.

12 Ya mere, ahapụrụ m ha na ndụ isiike ha,

ka ha soro nchepụta nke echiche ha.

13 "Ewoo, a sị na ndị m gaara ege m ntị,

a sịkwa na Izrel ga-eso ụzọ m niile.

14 Ọ gaghị adị anya mgbe m ga-eji ike m, wezuga ndị iro ya site nʼọnọdụ ha.

Aga m eweli aka m, megide ndị iro ya niile.

15 Ndị niile kpọrọ Onyenwe anyị asị, ga-ada nʼihu ya nʼụjọ.

Ịta ahụhụ ha ga-adịgidekwa, ruo ebighị ebi.

16 Ma a ga-eji ụtụ ọka wiiti kachasị mma, nyejuo unu afọ;

aga m ejikwa mmanụ aṅụ nke sitere nʼoke nkume, nyejuo unu afọ."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-