Publicidade

Salmos 18

Abụ ọma Devid. Abụ Devid ohu Onyenwe anyị. Ọ bụụrụ Onyenwe anyị okwu niile nke abụ a mgbe Onyenwe anyị napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl. Ọ sịrị:
Abụ mmeri

1 O Onyenwe anyị, ahụrụ m gị nʼanya, gị bụ ike m.

2 Onyenwe anyị bụ oke nkume m, na ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m.

Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya.

Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m, na oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya.

3 Akpọkuru m Onyenwe anyị, onye e kwesiri inye otuto,

ọ zọpụtara m site nʼaka ndị iro m.

4 Ụdọ niile nke ọnwụ kere m agbụ;

ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m.

5 Ụdọ nke ili kere m gburugburu,

ọnya nke ọnwụ guzogidere m.

6 Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị;

etiri m mkpu akwa, kpọkuo Chineke m ka o nyere m aka;

akwa m rutekwara ya ntị,

o sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m.

7 Ụwa mere mkpọtụ, maa jijiji,

ntọala niile nke ugwu niile makwara jijiji,

ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya.

8 Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta,

ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta;

icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta.

9 O kewara mbara eluigwe, rịdata;

oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya.

10 Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu,

o feliri elu nʼelu nku nke ifufe.

11 O mere ọchịchịrị ebe nzuzo ya, ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu,

bụ ọchịchịrị mmiri igwe ojii nke mbara eluigwe.

12 Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya, igwe ojii

ji mkpụrụ mmiri na amụma egbe eluigwe gabiga.

13 Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe bigbọọ;

olu Onye kachasị ihe niile elu dara ụda.

14 Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa,

o jikwa oke amụma nke egbe eluigwe chụsaa ha.

15 E kpughere ala ala nke oke osimiri,

gbakwa ntọala niile nke ụwa ọtọ,

site nʼịba mba gị, O Onyenwe anyị,

na nkuume si gị nʼimi pụta.

16 O sitere nʼelu setịpụ aka ya,

jidesie m aka ike, ọ dọpụtara m site nʼogbu mmiri niile.

17 Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike,

bụ ndị kpọrọ m asị, ndị dịkwa ike karịa m.

18 Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m,

ma Onyenwe anyị bụrụ m ihe ndabere.

19 Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara,

ọ napụtara m nʼihi na ihe m na-atọ ya ụtọ.

20 Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị;

ọ kwụghachiri m dịka ịdị ọcha nke aka m si dị.

21 Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke Onyenwe anyị,

ikpe amaghị m nʼihi ịgbakụta Chineke azụ.

22 Iwu ya niile dị nʼihu m,

esibekwaghị m nʼụkpụrụ ya wezuga onwe m.

23 Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya,

edebekwara m onwe m pụọ na mmehie.

24 Onyenwe anyị kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị,

dịka ịdị ọcha nke aka m abụọ si dị nʼanya ya.

25 Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi,

nʼebe onye zuruoke nọ, ị na-egosi onwe gị onye zuruoke.

26 Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha,

ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ.

27 Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi,

ma ị na-eme ka ndị nwere anya mpako dị ala.

28 Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, na-eme ka oriọna m na-enwu,

Chineke m na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè.

29 Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ,

sitekwa na Chineke m, apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla.

30 Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke,

okwu ọnụ Onyenwe anyị bụ ihe a nụchara anụcha;

ọ bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya.

31 Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị?

Onye bụkwa oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke anyị?

32 Ọ bụ Chineke na-enye m ike,

na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke.

33 Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele;

Ọ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu.

34 Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha,

ogwe aka m abụọ pụrụ ịrọji ụta bronz.

35 Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m,

aka nri gị na-akwagidekwa m,

inyeaka gị emeela m ka m dị ukwuu.

36 Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ,

ka nkwonkwo ụkwụ m ghara ịgbụchapụ.

37 Achụrụ m ndị iro m ọsọ, jidekwa ha;

alaghachighị m azụ tutu ruo mgbe ha niile lara nʼiyi.

38 Etidara m ha nʼala ebe ha enwekwaghị ike ibilite.

Ha dara nʼokpuru ụkwụ m.

39 Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha,

i wedara ndị niile na-emegide m nʼala nʼihu m.

40 I mere ka ndị iro m tụgharịa gbapụ ọsọ.

Ebibikwara m ndị kpọrọ m asị.

41 Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha.

Ha kpọkuru Onyenwe anyị, ma ọ zaghị ha.

42 Egwepịara m ha nke ọma dịka ntụ nke ikuku na-ebufu;

a zọtọrọ m ha dịka apịtị nke okporoụzọ.

43 Ị napụtala m site nʼaka ndị na-alụso m ọgụ

ị meela m onyeisi nke ọtụtụ mba;

ndị m na-amaghị na mbụ na-ejekwara m ozi.

44 Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu,

ngwangwa ha nụrụ olu m, ha na-erube isi nye m.

45 Obi na-ada ha mba;

ha na-ama jijiji mgbe ha na-esite nʼebe niile ha e wusiri ike na-apụta.

46 Onyenwe anyị na-adị ndụ! Otuto dịrị oke nkume m!

Mbuli elu dịrị Chineke, Onye nzọpụta m.

47 Ọ bụ Chineke ahụ onye na-abọrọ m ọbọ,

onye na-emekwa ka mba dị iche iche nọrọ nʼokpuru m,

48 onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m.

I mere ka m dị elu karịa ndị iro,

napụtakwa m site nʼaka nwoke na-eme ihe ike.

49 Nʼihi nke a, Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche,

aga m abụku aha gị abụ otuto.

50 Ọ na-enye eze ya mmeri dị ukwuu;

Ọ na-egosikwa onye ya onye e tere mmanụ ịhụnanya na-adịghị ada ada,

nye Devid na ndị agbụrụ ya ruo mgbe ebighị ebi.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-