Publicidade

Salmos 4

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid nke a na-eji ụbọ akwara akpọ.
Ntụgharị uche nke abalị

1 Zaa m mgbe m na-akpọku gị

Chineke m, gị onye ezi omume;

Napụta m site nʼihe mgbu m,

meere m ebere, nụrụkwa ekpere m.

2 Unu ụmụ mmadụ, ruo ole mgbe ka unu ga-atụgharịa ebube m, mee ka ọ bụrụ ihe ihere?

Ruo ole mgbe ka unu ga-ahụ ihe efu nʼanya na-achọ chi ndị ahụ na-abụghị chi nʼezie? Sela

3 Matanụ nke ọma na Onyenwe anyị ahọpụtala ndị ezi omume nye onwe ya;

ọ ga-egekwa ntị nʼolu m mgbe ọbụla m kpọkuru ya.

4 Maanụ jijiji, unu emehiekwala;

mgbe unu nọ nʼelu ihe ndina unu;

nọọnụ jụụ na-enyocha obi unu. Sela

5 Tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi unu,

chụkwaranụ ya aja ezi omume.

6 Ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ, "Onye pụrụ imere anyị ihe ọma?"

Ma Onyenwe anyị, biko mee ka ìhè nke ihu gị mụkwasị anyị.

7 Were ọṅụ mejupụta obi m

karịa mgbe mkpụrụ ubi, ya na mmanya ọhụrụ ha bara ụba nke ukwuu.

8 Aga m edina ala ma rahụ ụra nʼudo,

nʼihi na ọ bụ naanị gị Onyenwe anyị,

na-eme ka m nọrọ na-enweghị ihe egwu ọbụla.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-