Pular para o conteúdo
Publicidade

Abụ Ọma 41

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid.

Ekpere onye ọrịa

1 Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ ndị nwere uche na-eleta ndị ogbenye;

Onyenwe anyị na-azọpụta ha nʼoge nsogbu.

2 Onyenwe anyị ga-echebe ha, debekwa ha ndụ;

ga-eme ka ihe na-agara ha nke ọma nʼala ahụ,

gaghị arara ha nye nʼọchịchọ ndị iro ha.

3 Onyenwe anyị na-elekọta ha mgbe ahụ na-esighị ha ike,

meekwa ka ahụ dị ha mma.

4 Ekwuru m sị, "O Onyenwe anyị, meere m ebere;

gwọọ m, nʼihi na emehiela m megide gị."

5 Ndị iro m na-esite nʼiro ha ekwu okwu megide m

na-asị, "Olee mgbe ga-anwụ ka aha ya laa nʼiyi?"

6 Mgbe otu nʼime ha bịara ịhụ m,

na-ekwu okwu ụgha, ma obi ya na-achịkọta ihe nkwulu;

mgbe ahụ na-apụ, ga kọsaa ya.

7 Ndị niile kpọrọ m asị na-agbarịta izu megide m;

ha na-echekwa echiche ọjọọ banyere m, na-asịrịta onwe ha:

8 "Ọrịa ọjọọ adakwasịla ya;

gaghị esite na ihe ndina ya bilie ọtọ ọzọ."

9 bụladị ezigbo enyi m,

onye m tụkwasịrị obi,

onye mụ na ya na-eso erikọ nri m,

ebiliela imegide m.

10 Ma gị, O Onyenwe anyị, meere m ebere,

mee ka ahụ sie m ike ọzọ, ka m nwee ike kwụghachi ha ụgwọ.

11 Amaara m na ihe banyere m na-atọ gị ụtọ nʼobi,

nʼihi na i kwebeghị ka ndị iro m nwee mmeri nʼebe m nọ.

12 Nʼihi ikwesi ntụkwasị obi m, na-akwagide m,

mee ka m nọrọ nʼihu gị ruo mgbe ebighị ebi.

13 Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel,

site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.

Amen na Amen.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também