Pular para o conteúdo
Publicidade

Abụ Ọma 45

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ "Okoko osisi lili." Abụ maskil ụmụ Kora. Abụ maka agbamakwụkwọ.

Abụ ọlụlụ nwunye eze

1 Isi okwu dị ebube na-akpali mkpụrụobi m,

mgbe m na-agụgharị abụ m nye eze;

ire m bụ mkpisi akwụkwọ dị nʼaka ọka ode akwụkwọ.

2 I bụ onye kachasị mma nʼetiti ụmụ mmadụ,

e ji amara tee egbugbere ọnụ gị mmanụ,

ebe bụ na Chineke agọziela gị ruo mgbe ebighị ebi.

3 Kenye mma agha gị nʼukwu gị, gị onye dị ike;

yikwasị onwe gị ebube na ịma mma dịka uwe.

4 Nʼebube gị, gaa nʼihu nʼime mmeri,

nʼihi eziokwu, na ịdị obi umeala, na ezi omume;

ka aka nri gị gosipụta ọrụ gị niile nke na-eju anya.

5 Ka àkụ gị niile dị nkọ mapuo mkpụrụobi ndị iro niile nke eze;

ka mba niile na-adakwa nʼokpuru ụkwụ gị.

6 O Chineke, ocheeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,

mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ

7 hụrụ ezi omume nʼanya, ma kpọọ ihe ọjọọ asị;

ya mere, Chineke, onye bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị,

site na ite gị mmanụ nke ọṅụ.

8 Uwe gị niile jupụtara nʼisisi ụtọ nke si na mmanụ45:8 Nke a bụ mmanụ isi ọma a na-efesa nʼuwe. Ọ nọ nʼọnọdụ ihe anyị na-akpọ senti taa. Abk 1:12-13. máá na aloos na akashia;

ha sitere nʼụlọeze niile, e ji ọdụ enyi chọọ mma.

Egwu sitere nʼụbọ akwara na-eme ka i nwee obi ụtọ.

9 Ụmụ agbọghọ eze nọ nʼetiti ndị inyom gị ka a na-asọpụrụ;

nwunye eze, onye yikwasịrị ọlaedo nke Ọfịa na-eguzo nʼaka nri gị.

10 Gee ntị, gị nwaagbọghọ, tulee ma nụrụkwa ihe m na-ekwu:

"Chefuo ndị gị na ezinaụlọ nna gị.

11 Nʼihi na ịma mma gị ga-eme ka eze chọsie gị ike.

Sọpụrụ ya nʼihi na bụ onyenwe gị."

12 Ada Taịa45:12 Eze mbụ kwụnyeere ọchịchị alaeze Devid bụ eze obodo Taịa, nʼihi Solomọn na eze Taịa nweere ezigbo mmekọrịta dị mma. Taịa bụ isi obodo ebe niile a na-azụ ahịa nʼakụkụ osimiri Mediterenịan. ga-eji onyinye bịa;

ndị ọgaranya ga-achọkwa ka i gosi ha ihuọma.

13 Adaeze, lee ka o si maa mma dị ukwuu nʼime ụlọ ya;

bụ akwa a kpanyere ọlaedo ka e ji dụọ uwe mwụda ya.

14 Ụmụ agbọghọ ibe ya, ndị na-amaghị nwoke, na-eso ya bịakwute gị;

bụ uwe mwụda a kpanyere ihe ọkpụkpa ka o yi

mgbe e dubatara ya nʼụlọeze.

15 E ji ọṅụ na obi ụtọ dubata ha;

ha bara nʼime ụlọeze.

16 Ụmụ gị ndị ikom ga-anọchi anya nna nna gị;

ga-eme ka ha bụrụ ndịisi nʼala ahụ niile.

17 Aga m eme ka echeta ihe banyere gị ruo ọgbọ niile;

nʼihi nke a, mba niile ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também