Publicidade

Salmos 37

Abụ Ọma Devid.
Ọgwụgwụ ndụ mmadụ

1 Echegbula onwe gị nʼihi ndị na-eme ihe ọjọọ,

maọbụ kwosa ndị na-eme ihe ọjọọ ekworo;

2 nʼihi na mgbe na-adịghị anya, ha ga-akpọnwụ dịka ahịhịa,

dịka ahịhịa ndụ, ha ga-anwụkwa.

3 Tụkwasị Onyenwe anyị obi meekwa ihe ziri ezi;

biri nʼala na nchebe, rijuokwa afọ.

4 Ka ihe Onyenwe anyị tọọ gị ụtọ.

Ọ ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị.

5 Nyefee onwe gị nʼaka Onyenwe anyị;

tụkwasị ya obi, ọ ga-emere gị nke a:

6 Ọ ga-eme ka ezi omume gị pụta ìhè dịka ihe nke chị ọbụbọ,

meekwa ka izi ezi nke ikpe gị dịka ihe nke anyanwụ nʼehihie.

7 Dere duu nʼihu Onyenwe anyị,

were ndidi chere ya;

echegbula onwe gị mgbe ndị ọzọ na-enwe ọganihu,

mgbe ha na-emezu atụmatụ ọjọọ ha niile.

8 Kwụsị iwe iwe, kwụsịkwa oke iwe;

echegbula onwe gị, ọ na-eduba naanị nʼihe ọjọọ.

9 Nʼihi na a ga-ala ndị ajọ omume nʼiyi,

ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha.

10 Ọ fọdụrụ nwa oge nta, ndị ajọ omume ga-agabiga;

ọ bụ ezie na ị ga-achọ ha, ma ị gaghị achọta ha.

11 Ma ndị niile dị nwayọọ nʼobi ga-eketa ala a dịka ihe nketa ha,

ha ga-enwekwa udo dị ukwuu.

12 Ndị ajọ omume na-agba izu ọjọọ megide ndị ezi omume,

na-ata ikekere eze megide ha;

13 ma onyenwe anyị na-achị ndị ajọ omume ọchị,

nʼihi na ọ maara na ụbọchị ha na-abịa.

14 Ndị ajọ omume amịpụtala mma agha ha,

kwee ụta ha

ime ka ndị nọ na mkpa na ndị ogbenye daa,

igbu ndị ụzọ ha ziri ezi.

15 Ma ha ga-ewere mma agha ha gbuo onwe ha,

kụrisiekwa ụta ha.

16 Ihe ntakịrị nke onye ezi omume nwere

dị mma karịa akụnụba ọtụtụ ndị ajọ omume;

17 nʼihi na a ga-etiji ike niile nke ndị ajọ omume,

ma Onyenwe anyị ga-akwagide ndị ezi omume.

18 Ndị na-enweghị ịta ụta na-ebi ndụ ha nʼokpuru nlekọta Onyenwe anyị,

ihe nketa ha ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

19 Nʼoge ihe ndakwasị, ha agaghị akpọnwụ;

ha ga-erijukwa afọ nʼụbọchị ụnwụ.

20 Ma ndị ajọ omume ga-ala nʼiyi.

Nʼagbanyeghị na ndị iro Onyenwe anyị dịka ịma mma nke ubi ahịhịa ndụ,

ha ga-agabigakwa ngwangwa nʼanya dịka anwụrụ ọkụ.

21 Ndị na-eme ihe ọjọọ na-ebiri mmadụ ihe ma ha adịghị akwụghachi ya,

ma onye ezi omume na-eme amara na-enye ndị ọzọ ihe o nwere.

22 Ndị Onyenwe anyị gọziri agọzi ga-eketa akụ nke ụwa,

ma ndị ọ bụrụ ọnụ ka a ga-egbuchapụ.

23 Ọ bụrụ na Onyenwe anyị nwere mmasị na ndụ mmadụ,

ọ ga-eme ka nzọ ụkwụ ya guzosie ike;

24 ọ bụrụ na ọ kpọbie ụkwụ, ọ gaghị ada,

nʼihi na Onyenwe anyị na-eji aka ya ejigide ya.

25 Abụ m nwantakịrị na mbụ, ugbu a, abụ m agadi,

ma ahụbeghị m ebe e chefuru ndị ezi omume,

maọbụ ebe ụmụ ha na-arịọ nri.

26 Mgbe niile, ha na-eme amara jiri obi ha na-agbazinye ndị mmadụ ihe,

ụmụ ha ga-abụ ngọzị.

27 Site nʼihe ọjọọ pụọ, mee ezi ihe,

mgbe ahụ, i ga-ebi nʼala a ruo mgbe ebighị ebi.

28 Onyenwe anyị na-ahụ onye ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya.

Ọ gaghị ahapụkwa ndị ya kwesiri ntụkwasị obi.

A ga-echebe ha ruo mgbe ebighị ebi,

ma ụmụ ndị ajọ omume ka a ga-egbuchapụ;

29 ndị ezi omume ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha,

ha ga-ebikwa nʼime ya ruo mgbe ebighị ebi.

30 Okwu amamihe na-esi nʼọnụ onye ezi omume pụta,

ire ya na-ekwukwa ihe ziri ezi.

31 Iwu Chineke ya dị ya nʼobi;

nzọ ukwu ha adịghị agbụchapụ.

32 Ndị ajọ omume na-echere ndị ezi omume na nzuzo,

na-achọ ịnapụ ha ndụ ha;

33 ma Onyenwe anyị agaghị ahapụ ha nʼaka ha,

ọ gaghị ekwe ka a maa ha ikpe mgbe a na-ekpe ha ikpe.

34 Chere Onyenwe anyị,

debekwa ụzọ ya.

Ọ ga-ebuli gị elu ka i nweta ala ahụ dịka ihe nketa;

mgbe a na-egbuchapụ ndị ajọ omume, ị ga-eji anya gị hụ ya.

35 Ahụla m onye ajọ omume na nwoke na-eme ihe ike,

ka ọ na-eto, na-awasa, dịka osisi dị ndụ nʼezi ala,

36 ma ọ dịghị anya, ọ nwụrụ,

nʼagbanyeghị na m chọgharịrị ya, ọ dịghị ebe ọbụla a hụrụ ya.

37 Ma tụgharịa uche banyere ndị ezi omume, rịbaa ndị ụzọ ha ziri ezi ama;

ọganihu dịịrị onye udo.

38 Ma a ga-ala ndị mmehie niile nʼiyi;

ọ dịghị olileanya dịịrị ndị ajọ omume.

39 Nzọpụta nke ndị ezi omume si nʼaka Onyenwe anyị bịa;

ọ bụ ebe ha e wusiri ike nʼoge nsogbu.

40 Onyenwe anyị na-enyere ha aka, na-anapụtakwa ha

ma na-azọpụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume,

nʼihi na ha mere ya ebe mgbaba ha.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-