Publicidade

Salmos 97

Chineke onye na-achị ihe niile

1 Onyenwe anyị bụ eze, ka ụwa niile nwee obi ụtọ;

ka ndị niile bi nʼebe dị anya ṅụrịa.

2 Igwe ojii na oke ọchịchịrị gbara ya gburugburu;

ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ntọala ocheeze ya.

3 Ọkụ na-enwu enwu na-aga nʼihu ya

ọ na-erepịasị ndị iro ya nʼakụkụ ya ọbụla.

4 Amụma ya na-acha chazuo elu ụwa niile;

ụwa niile na-ahụ ya na-ama jijiji.

5 Ugwu niile na-agbaze dịka mmanụ nʼihu Onyenwe anyị,

nʼihu Onyenwe ụwa niile.

6 Eluigwe na-ekwuwapụta ezi omume ya;

ndị niile bi nʼụwa na-ahụkwa ebube ya.

7 A na-eme ka ihere mee ndị niile na-efe arụsị niile a pịrị apị ofufe,

ndị na-anya isi na chi niile e jiri aka mee

feenụ ya ofufe, unu chi niile!

8 Zayọn na-anụ ma na-aṅụrịkwa ọṅụ,

obodo nta niile nke Juda na-enwekwa obi ụtọ

nʼihi ikpe gị, O Onyenwe anyị.

9 Nʼihi na gị, O Onyenwe anyị, bụ Onye kachasị ihe niile elu nʼụwa niile;

ị bụ onye e buliri elu karịa chi ndị ọzọ niile.

10 Ka unu, ndị hụrụ Onyenwe anyị nʼanya, kpọọ ihe ọjọọ asị,

nʼihi na ọ na-echebe ndụ ndị nke ya, ndị tụkwasịrị ya obi

ma na-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume.

11 Ìhè na-amụkwasị onye ezi omume,

ọṅụ na-adịkwa nʼime obi onye na-eme ihe ziri ezi.

12 Ṅụrịanụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume,

tookwanụ aha nsọ ya.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-