Pular para o conteúdo
Publicidade

Abụ Ọma 98

Abụ Ọma.

Toonu Onyenwe anyị onye ezi omume

1 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ,98:1 Abụ 96:1

nʼihi na rụọla ọtụtụ ọrụ dị ebube;

aka nri ya na aka nsọ ya

arụpụtarala ya nzọpụta.

2 Onyenwe anyị emeela ka a mata nzọpụta ya

o kpugheela ezi omume ya nye mba niile.

3 O chetala ịhụnanya ya

na ikwesi ntụkwasị obi ya nʼebe ụlọ Izrel dị;

nsọtụ nke ụwa niile ahụla

nzọpụta Chineke anyị.

4 Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile

jirinụ iti egwu tiwaa mkpu abụ ọṅụ;

5 werenụ ụbọ akwara bụkuo Onyenwe anyị abụ,

e, were ụbọ akwara na olu abụ ọma,

6 jirinụ opi na opi ike,

tisie mkpu ọṅụ ike nʼihu Onyenwe anyị, Onye bụ Eze.

7 Ka oke osimiri niile gbọọ ụja, ya na ihe niile dị nʼime ya,

ụwa na ndị niile bi nʼime ya.

8 Ka osimiri na iyi niile kụọ aka ha,

ka ugwu niile bụkuokwa ya abụ nʼihi ọṅụ;

9 ka ha bụọ abụ nʼihu Onyenwe anyị,

nʼihi na na-abịa ikpe ụwa ikpe.

ga-eji ezi omume kpee ụwa ikpe.

ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também