Publicidade

Salmos 118

Kelee Onyenwe anyị

1 Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma;

ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

2 Ka ụmụ Izrel kwupụta nʼonwe ha sị,

"Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi."

3 Ka ndị ezinaụlọ Erọn kwuokwa sị,

"Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi."

4 Ka ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị kwuo sị,

"Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi."

5 Nʼọnọdụ oke ihe mgbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị,

ọ zara m, mee ka m nwere onwe m.

6 Onyenwe anyị nọnyeere m, agaghị m atụ egwu.

Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?

7 Onyenwe anyị nọnyere m; ọ bụ onye na-enyere m aka.

Aga m ele ndị iro m anya na mmeri.

8 Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị

karịa ịtụkwasị ụmụ mmadụ obi.

9 Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị

karịa ịtụkwasị ndị amara aha ha obi.

10 Mba niile gbara m gburugburu

ma site nʼaha Onyenwe anyị aga m ala ha nʼiyi.

11 Ha gbara m gburugburu,

ma site nʼaha Onyenwe anyị ka m na-egbuda ha.

12 Ha gbara m gburugburu dịka aṅụ,

ma e menyụọla ha dịka ogwu na-ere ọkụ;

site nʼaha Onyenwe anyị, ka m na-egbuda ha.

13 Akwaghachiri m azụ, agaara m ada,

ma Onyenwe anyị nyere m aka.

14 Onyenwe anyị bụ ike m na abụ m;

ọ ghọọla nzọpụta m.

15 Olu iti mkpu ọṅụ na mmeri

na-ada nʼime ụlọ ikwu ndị ezi omume:

"Aka nri Onyenwe anyị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!

16 Aka nri Onyenwe anyị bụ ihe e weliri elu;

aka nri Onyenwe anyị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!"

17 Agaghị m anwụ,

kama aga m adị ndụ kwusaara ndị ọzọ ọrụ ebube Onyenwe anyị rụrụ.

18 Onyenwe anyị tara m ahụhụ nke ukwuu,

ma o nyefeeghị m nʼaka ọnwụ.

19 Megheere m ọnụ ụzọ ama nke ezi omume;

aga m abanye nye Onyenwe anyị ekele.

20 Nke a bụ ọnụ ụzọ ụlọnsọ Onyenwe anyị,

ebe ndị ezi omume ga-esite na ya banye.

21 Aga m enye gị ekele, nʼihi na ị zara m;

ị ghọọla nzọpụta m.

22 Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ,

aghọọla nkume isi ntọala ụlọ;

23 nke a bụ ọrụ aka Onyenwe anyị,

ọ bụkwa ihe ịtụnanya nʼanya anyị.

24 Nke a bụ ụbọchị Onyenwe anyị anyị mere,

ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime ya.

25 O Onyenwe anyị, zọpụta anyị;

o Onyenwe anyị, mee ka ihe gaara anyị nke ọma.

26 Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị.

Anyị sitere nʼụlọ Onyenwe anyị na-agọzi gị.

27 Onyenwe anyị bụ Chineke,

ọ bụ ya mere ka ìhè ya mụkwasị anyị.

Chịrị igu nkwụ nʼaka gị, soro ndị ji ọṅụ bata nʼogige Chineke

bịaruo nʼebe ịchụ aja.

28 Ị bụ Chineke m, aga m eto gị;

ị bụ Chineke m, aga m ebuli gị elu.

29 Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma,

ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-