Publicidade

Salmos 79

Abụ Ọma Asaf.
Akwa nʼihi mbibi Jerusalem

1 O Chineke, mba dị iche iche abatala nʼihe nketa gị;

ha emerụọla ụlọnsọ ukwuu gị,

ha etikpọọla Jerusalem, mee ka ọ tọgbọrọ nʼefu.

2 Ha ewerela ozu ndị ohu gị nye anụ ufe niile nke eluigwe

ka ọ bụrụ ihe oriri nye ha,

werekwa ozu nke ndị nsọ gị nye anụ ọhịa niile nke ụwa.

3 Ha awụpụla ọbara dịka mmiri

nʼakụkụ niile nke Jerusalem,

ọ dịghị otu onye fọdụrụ nke ga-eli ndị nwụrụ anwụ.

4 Anyị aghọọla ihe ịta ụta nʼebe ndị agbataobi anyị nọ,

ghọọkwara ndị gbara anyị gburugburu ihe ịchị ọchị, na ihe ịkwa emo.

5 O Onyenwe anyị, ruo olee mgbe? Ị ga-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi?

Ruo olee mgbe ka ekworo gị ga na-ere dịka ọkụ?

6 Wụkwasị mba niile ndị na-amaghị gị

dịka Chineke oke iwe gị,

bụ alaeze niile ndị ahụ

na-adịghị akpọku aha gị;

7 nʼihi na ha eripịala Jekọb

mekwaa ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu.

8 Atala anyị ahụhụ mmehie nke nna nna anyị mere;

ka ebere gị bịa ngwangwa zute anyị,

nʼihi na anyị nọ nʼọnọdụ oke mkpa.

9 Nyere anyị aka, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị,

nʼihi ebube nke aha gị;

napụta anyị, gbaghara mmehie anyị niile

nʼihi aha gị.

10 Gịnị mere ndị mba ọzọ ji na-ajụ ajụjụ sị,

"Olee ebe Chineke ha nọ?"

Nʼihu anyị, mee ka a mara nʼetiti ndị mba ọzọ,

na ị na-abọ ọbọ ọbara ndị ohu gị niile a wufuru.

11 Gee ntị nʼịsụ ude nke ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ;

site nʼike nke aka gị chebe ndị niile a mara ikpe ọnwụ.

12 Bọọ ọbọ ugboro asaa megide ndị agbataobi anyị

nʼihi ụta ha tara gị, O Onyenwe anyị.

13 Mgbe ahụ, anyị bụ ndị gị, ụmụ igwe atụrụ gị

ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi;

anyị ga na-ekwupụta otuto gị,

site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-