Publicidade

Salmos 1

Onye ihe na-agara nke ọma

1 Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ,

onye na-adịghị aga ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu;

onye na-adịghị eguzokwa nʼụzọ ndị mmehie

maọbụ soro nʼotu ndị nkwutọ.

2 Kama ihe na-atọ ya ụtọ bụ ime ihe niile dị nʼiwu Onyenwe anyị.

Ọ na-atụgharịkwa uche ya nʼiwu Onyenwe anyị ehihie na abalị,

3 Ọ dị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi,

nke na-amịpụta mkpụrụ ya nʼoge ya,

nke ahịhịa ya na-adịghị akpọnwụ akpọnwụ.

Ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma.

4 Ma ndị ajọ omume adịghị otu a.

Ha dị ka igbugbo ọka

nke oke ifufe na-efesasị.

5 Ya mere, ndị ajọ omume agaghị eguzosi ike nʼụbọchị ikpe;

ndị mmehie agaghị eguzokwa na nzukọ ndị ezi omume.

6 Nʼihi na Onyenwe anyị na-eche ụzọ ndị ezi omume nche.

Ma ụzọ ndị ajọ omume ga-eduba ha nʼịla nʼiyi.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-