Publicidade

Salmos 139

Abụ nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid.
Chineke maara ihe niile

1 O Onyenwe anyị, ị nyochaala m,

ị makwaara m nke ọma

2 Ị maara mgbe m na-anọdụ ala na mgbe m na-eguzo ọtọ;

site nʼebe dị anya, ị na-aghọta echiche obi m niile.

3 Ị na-ahụzu ọpụpụ m na ndina ala m;

ị mazukwara ụzọ m niile.

4 O Onyenwe anyị, ị maara ihe m gaje ikwu

tupu m kwuo ya.

5 Ị na-anọ m nʼihu, ma na-esokwa m nʼazụ,

ị tụkwasịla m aka gị.

6 Ihe ọmụma dị otu a dị oke omimi nye m,

ọ dịkwa elu apụghị m iru ya.

7 Ebee ka m ga-ezo onwe m si otu a zonarị Mmụọ gị?

Ebeekwa ka m pụrụ ịgbaga ka m si nʼihu gị zoo onwe m?

8 Ọ bụrụ na m arịgoro nʼeluigwe ị nọ nʼebe ahụ.

Ọ bụrụkwa na m arịda zoo onwe m nʼala mmụọ, ị nọkwa nʼebe ahụ.

9 Ọ bụrụ na m efepụ nʼisi ụtụtụ dịka nwa nnụnụ, felagaa

nʼebe dị nnọọ anya nke oke osimiri,

10 ọ bụladị nʼebe ahụ ka aka gị ga na-edu m

aka nri gị ga-ejidesi m ike.

11 Ọ bụrụ na m asị, "Nʼezie, ọchịchịrị ga-ekpuchi m

ìhè ga-aghọ abalị gbaa m gburugburu."

12 Ọ bụladị ọchịchịrị agaghị abụ ọchịchịrị nʼebe ị nọ;

abalị ga-enye ìhè dịka ehihie,

nʼihi na ọchịchịrị dị ka ìhè nʼebe ị nọ.

13 Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ.

Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m.

14 Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee;

ọrụ gị niile dị ebube;

amaara m nke a nke ọma.

15 Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọ

mgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ,

mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa.

16 Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla.

E dere ụbọchị niile a kwadoro m nʼime akwụkwọ gị

tupu otu nʼime ha adịrị.

17 Lee ka echiche ị na-eche banyere m si dị oke ọnụahịa, o Chineke!

Leekwa ka ha si dị ukwuu.

18 Ọ bụrụ na m agụọ ha ọnụ,

ha ga-adị ukwuu karịa ọnụọgụgụ aja dị nʼala.

Mgbe m tetara, mụ na gị ka nọ.

19 O Chineke, a sịkwarị na ị ga-ala ndị ajọ omume niile nʼiyi!

Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-akwafu ọbara!

20 Site nʼechiche ọjọọ, ha na-ekwu okwu banyere gị;

ndị iro gị na-ekwutọ aha gị.

21 O Onyenwe anyị, ọ bụ na m akpọghị ha asị bụ ndị kpọrọ gị asị,

na-asọkwa ndị na-enupu isi megide gị oyi?

22 Ọ bụ naanị ịkpọ asị ka m nwere nʼebe ha nọ?

Ana m agụnye ha dịka ndị iro m.

23 O Chineke, nyochaa m, mara obi m.

Nwaa m, matakwa echiche uche m niile.

24 Chọpụta ma o nwere ihe ọjọọ dị nʼime m,

ma duo m nʼụzọ ebighị ebi.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-