Publicidade

Salmos 76

Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nke eji ụbọ akwara akpọ. Abụ Ọma Asaf. Otu Abụ.
Ike mmeri nke Chineke

1 A maara Chineke nʼobodo Juda;

aha ya dị ukwuu nʼobodo Izrel.

2 Ụlọ ikwu ya dị na Salem,

ebe obibi ya dị na Zayọn

3 Ebe ahụ ka o tijisịrị àkụ niile na-egbu amụma,

na ọta niile, na mma agha niile, na ngwa agha niile. Sela

4 Ị jupụtara nʼìhè,

ị dị oke ebube karịa ọtụtụ ugwu nke anụmanụ jupụtara.

5 A pụnarịla ndị nwere obi ike ihe ha,

ha na-arahụkwa ụra ikpeazụ ha;

o nweghị otu onye nʼime ndị dike nʼagha ndị a

pụrụ iweli aka ya abụọ elu.

6 Nʼihi ịba mba gị, O Chineke nke Jekọb,

ịnyịnya na ụgbọ agha na-anọ juu.

7 Ọ bụ naanị gị ka e kwesiri ịtụ egwu.

Onye pụrụ iguzo nʼihu gị mgbe i na-ewe iwe?

8 I sitere nʼeluigwe mee ka a nụ olu ikpe ikpe gị.

Ụwa tụkwara egwu, dere duu,

9 mgbe gị, O Chineke, biliri ikpe ikpe,

ịzọpụta ndị niile a na-akpagbu nʼala a. Sela

10 Nʼezie, oke iwe gị megide ụmụ mmadụ na-ewetara gị otuto,

ndị fọdụrụ mgbe oke iwe gị gabigasịrị, na-anọ juu.

11 Kwenụ Onyenwe anyị Chineke nkwa ma mezuokwa ha;

ka ndị ala niile bụ agbataobi unu

wetara onye ahụ e kwesiri ịtụ egwu onyinye dị iche iche.

12 Ọ na-eweda ndị na-achị achị nʼala;

ndị eze niile nke ụwa na-atụ ya egwu.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-