Publicidade

Salmos 137

Abụ ndị a dọtara nʼagha

1 Nʼakụkụ iyi niile Babilọn ka anyị nọdụrụ ala kwaa akwa

mgbe anyị chetara Zayọn.

2 Ọ bụ nʼosisi pọpla

ka anyị kokwasịrị ụbọ akwara anyị niile.

3 Nʼebe ahụ ka ndị dọtara anyị nʼagha gwara anyị ka anyị bụọrọ ha abụ,

ndị na-emekpa anyị ahụ rịọrọ anyị ka anyị bụọrọ ha abụ ọṅụ;

ha kwuru sị, "Bụọrọnụ anyị otu abụ nʼime abụ Zayọn!"

4 Ma, olee otu anyị ga-esi bụọ abụ Onyenwe anyị

ebe anyị nọ nʼala ọzọ?

5 Ọ bụrụ na m echezọọ gị, Jerusalem,

ka aka nri m chefuo ǹka ya.

6 Ọ bụrụ na m echezọọ gị,

ọ bụrụkwa na m akwụsị iche echiche

banyere Jerusalem, oke ọṅụ m,

ka ire m rapara nʼokpo ọnụ m.

7 Cheta, o Onyenwe anyị, ihe ndị Edọm mere

nʼụbọchị ahụ a dọtara Jerusalem nʼagha.

"Tikpọsịa ya," ka ha tiri,

"Tikpọsịa ya ruo na ntọala ya niile!"

8 Gị ada Babilọn, onye a ghaghị ịla nʼiyi,

ọṅụ ga-abụ nke onye ahụ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ ruru gị

nʼihi ihe i mere anyị,

9 onye ahụ ga-achịrị ụmụ gị ndị na-aṅụ ara

tụpịa ha nʼelu nkume.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-