Pular para o conteúdo
Publicidade

Abụ Ọma 137

Abụ ndị a dọtara nʼagha

1 Nʼakụkụ iyi niile Babilọn ka anyị nọdụrụ ala kwaa akwa

mgbe anyị chetara Zayọn.

2 bụ nʼosisi pọpla

ka anyị kokwasịrị ụbọ akwara anyị niile.

3 Nʼebe ahụ ka ndị dọtara anyị nʼagha gwara anyị ka anyị bụọrọ ha abụ,

ndị na-emekpa anyị ahụ rịọrọ anyị ka anyị bụọrọ ha abụ ọṅụ;

ha kwuru sị, "Bụọrọnụ anyị otu abụ nʼime abụ Zayọn!"

4 Ma, olee otu anyị ga-esi bụọ abụ Onyenwe anyị

ebe anyị nọ nʼala ọzọ?

5 bụrụ na m echezọọ gị, Jerusalem,

ka aka nri m chefuo ǹka ya.

6 bụrụ na m echezọọ gị,

bụrụkwa na m akwụsị iche echiche

banyere Jerusalem, oke ọṅụ m,

ka ire m rapara nʼokpo ọnụ m.

7 Cheta, o Onyenwe anyị, ihe ndị Edọm mere

nʼụbọchị ahụ a dọtara Jerusalem nʼagha.137:7 Mgbe Nebukadneza meriri Jerusalem, ma bibiekwa ya, ndị Edọm ṅụrịrị oke ọnụ nʼihi na ndị Izrel bụ ndị iro ha. Ma omume a ezighị ezi nʼihi na ndị Edọm na ndị Izrel bụ ụmụnna. Ndị Edọm bụ ụmụ ụmụ Ịsọ, Izk 25:12-14; Ems 1:11; Ọbd 10-14

"Tikpọsịa ya," ka ha tiri,

"Tikpọsịa ya ruo na ntọala ya niile!"

8 Gị ada Babilọn, onye a ghaghị ịla nʼiyi,

ọṅụ ga-abụ nke onye ahụ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ ruru gị

nʼihi ihe i mere anyị,

9 onye ahụ ga-achịrị ụmụ gị ndị na-aṅụ ara

tụpịa ha nʼelu nkume.137:9 Nʼoge agha, ndị meriri nʼagha na-achịkọta ụmụaka niile dị nʼobodo ahụ ha meriri, tụpịasịa ha isi na nkume. Ha na-eme nke a i ji mesie mmeri ha meriri obodo ahụ ike, nakwa i ji mee ka a ghara inwe ọgbọ ọzọ ga-ebili nʼobodo ahụ. 2Ez 8:12; Aịz 13:16; Hos 13:16; Nhu 3:10

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também