Publicidade

Salmos 82

Abụ Ọma Asaf.
Chineke onye ikpe kachasị ndị ikpe

1 Chineke na-ewere ọnọdụ ịchị isi nʼetiti ọgbakọ dị ukwuu;

ọ na-ekpebi ikpe nʼetiti chi niile.

2 Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ekpe ikpe na-ezighị ezi?

Ruo ole mgbe ka unu ga na-egosi ndị ajọ omume ihuọma? Sela

3 Kperenụ ndị na-adịghị ike na ndị na-enweghị nna ikpe ziri ezi;

hụnụ na ndị ogbenye na ndị a na-emegbu nwetara ihe ruuru ha.

4 Gbapụtanụ ndị na-adịghị ike na ndị nọ na mkpa;

napụta ha site nʼaka ndị ajọ omume.

5 Ha amaghị ihe ọbụla, ha aghọtaghị ihe ọbụla.

Ha na-ejegharị nʼọchịchịrị;

ntọala niile nke ụwa na-ama jijiji.

6 "Asịrị m, ‘Unu bụ "chi,"

unu niile bụ ụmụ ndị ikom nke Onye kachasị ihe niile elu.’

7 Ma unu ga-anwụ ọnwụ dịka mmadụ ndị ọzọ;

unu ga-ada dịka ndị ọchịchị ọzọ."

8 O Chineke, bilie kpee ụwa ikpe,

nʼihi na mba niile bụ ihe nketa gị.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-