Publicidade

Salmos 30

Abụ Ọma. Abụ nke ido obieze Devid nsọ.
Abụ mgbapụta

1 Aga m eto gị, O Onyenwe anyị,

nʼihi na i sitere nʼebe dị omimi dọpụta m.

I kweghị ka ndị iro m chịa m ọchị.

2 O Onyenwe anyị Chineke m, akpọkuru m gị, ka i nyere m aka,

ị gwọkwara m.

3 O Onyenwe anyị, i si nʼala ili kpọpụta m,

i mere ka m dịrị ndụ.

4 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ndị nsọ ya,

toonu aha nsọ ya.

5 Iwe ya adịghị adịgide tee anya,

ma ime amara ya na-adị ruo ebighị ebi!

Ịkwa akwa nwere ike dịrị ogologo abalị niile,

ma iti mkpu ọṅụ ga-adị nʼụtụtụ.

6 Mgbe m nọ nʼudo, asịrị m,

"Ihe ọbụla apụghị ịnapụ m udo m."

7 O Onyenwe anyị, mgbe i gosiri m ihuọma,

i mere ka m kwụrụ chịm dịka ugwu;

ma mgbe i zoro ihu gị site nʼebe m nọ,

adara m mba.

8 Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, ka m kpọkuru;

ọ bụkwa onyenwe anyị ka m rịọrọ arịrịọ amara sị,

9 "Uru gịnị dị ma m laa nʼiyi?

Uru gịnị dị ma m rịda nʼili?

Uzuzu aja ọ ga-enye gị otuto?

Ọ ga-ekwusa banyere ikwesi ntụkwasị obi gị?"

10 O Onyenwe anyị, gee m ntị ma meere m ebere;

O Onyenwe anyị, bụụrụ m onye inyeaka.

11 I meela ka iti mkpu akwa m ghọọ ite egwu;

ị napụrụ m akwa mkpe m, ma yinye m ọṅụ dịka akwa mmemme.

12 I mere nke a ka obi m bụọ maka otuto gị, ghara ịnọ nwayọọ.

O Onyenwe anyị Chineke m, aga m eto gị ruo mgbe ebighị ebi.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-