Publicidade

Salmos 119

א Alef

1 Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta ọbụla,

ndị na-ejegharị dịka iwu Onyenwe anyị si dị.

2 Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ụkpụrụ ya

ma jirikwa obi ha niile na-achọsi ya ike.

3 Ha adịghị eme ihe ọjọọ ọbụla;

ha na-ejegharị nʼụzọ ya niile.

4 I doola ụkpụrụ

ndị a ga-erubekwara isi.

5 Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na m anọgidesie ike

na-erube isi nye iwu gị niile!

6 Mgbe ahụ, ihere agaghị eme m

mgbe m tulere uche nʼiwu gị niile.

7 Aga m eji obi ziri ezi too gị

dịka m na-amụ ihe banyere iwu gị ziri ezi.

8 Aga m erubere iwu gị niile isi;

biko ahapụkwala m.

ב Bet

9 Olee ụzọ nwa okorobịa ga-esi bie ndụ dị nsọ?

Ọ bụ site nʼibi ndụ dịka okwu gị si dị.

10 Eji m obi m niile na-achọsi gị ike.

Ekwela ka m kpafuo site nʼihe niile i nyere nʼiwu.

11 Ezoola m okwu gị niile nʼobi m,

igbochi m imehie imegide gị.

12 Otuto dịrị gị, o Onyenwe anyị;

kuziere m iwu gị niile.

13 Aga m eji egbugbere ọnụ m gụgharịa

iwu niile nke si nʼọnụ gị.

14 Ana m aṅụrị ọṅụ nʼịgbaso iwu gị niile

dịka mmadụ si aṅụrị ọṅụ nʼime oke ịba ụba.

15 Ana m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị

na-atulekwa uche nʼụzọ gị niile.

16 Iwu gị na-amasị m;

agaghị m elefu okwu gị anya.

ג Gimel

17 Meere ohu gị ihe ọma, ka m nwe ike dị ndụ;

aga m erubere okwu gị isi.

18 Kpughee anya m abụọ

ka m hụ oke ihe ebube niile dị iche iche dị nʼime okwu gị.

19 Abụ m onye ọbịa nʼelu ụwa;

ezonarịla m iwu gị niile.

20 Nʼoge niile, ihe banyere iwu gị niile

na-agụ mkpụrụobi m agụụ.

21 Ị na-abara ndị mpako mba, ha bụ ndị a bụrụ ọnụ

na ndị na-anaghị agbaso iwu gị.

22 Site nʼebe m nọ wepụ ịchị ọchị na nlelị,

nʼihi na m na-edebe ụkpụrụ gị niile.

23 Nʼagbanyeghị na ndịisi nọkọrọ na-ekwulu m,

ohu gị ga-atụgharị uche nʼiwu gị.

24 Ụkpụrụ gị niile bụ ihe na-amasị m;

ha bụ ndị ndụmọdụ m.

ד Dalet

25 Mkpụrụobi m na-arapara nʼuzuzu;

kpọghachite ndụ m dịka okwu gị si dị.

26 Akọwaara m gị ụzọ m niile, ị zakwara m;

ugbu a, kuziere m iwu gị.

27 Mee ka m ghọta ozizi ụkpụrụ gị;

ka m nwe ike tụgharịa uche nʼọrụ ebube gị niile.

28 Iru ụjụ emeela ka mkpụrụobi m daa mba;

gbaa m ume dịka okwu gị si dị.

29 Chebe m pụọ nʼụzọ aghụghọ niile;

site nʼiwu gị meere m amara.

30 Ahọrọla m ụzọ ikwesi ntụkwasị obi;

e kpebiela m idebe obi m nʼiwu gị niile.

31 O Onyenwe anyị, ana m ejigidesi iwu gị niile aka ike;

ekwela ka ihere mee m.

32 Aga m agbaso iwu gị niile

nʼihi na i meela ka obi m nwere onwe ya.

ה He

33 O Onyenwe anyị, zi m ụzọ m ga-esi gbasoo iwu gị niile;

mgbe ahụ, aga m edebe ha ruo nʼọgwụgwụ.

34 Nye m nghọta, aga m edebe iwu gị

ma jiri obi m niile rubere ya isi.

35 Duo m nʼụzọ nke iwu gị niile,

nʼihi na ọ bụ nʼime ha ka m na-achọta obi ụtọ.

36 Mee ka obi m chee ihu nʼiwu gị niile

ọ bụghị nye uru na-esite nʼọchịchọ nke onwe.

37 Wepụ anya m site nʼihe na-abaghị uru;

chebe ndụ m dịka okwu gị si dị.

38 Mezuo nkwa i kwere ohu gị,

ka a tụọ egwu gị.

39 Wepụ nkọcha nke m na-atụ egwu ya,

nʼihi na iwu gị niile ziri ezi.

40 Ụkpụrụ gị na-agụsị m agụụ ike!

Chebe ndụ m site nʼezi omume gị.

ו Waw

41 O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị nke na-adịgide bịakwasị m,

nzọpụta gị dịka nkwa i kwere si dị;

42 mgbe ahụ, aga m azaghachi onye ahụ na-achị m ọchị,

nʼihi na ana m atụkwasị obi m nʼokwu gị.

43 Esitela nʼọnụ m napụ okwu nke eziokwu,

nʼihi na olileanya m dị nʼiwu gị niile.

44 Aga m anọgide na-erubere iwu gị isi

ruo mgbe ebighị ebi.

45 Aga m ejegharị nʼọnọdụ inwere onwe

nʼihi na achọpụtala m ụkpụrụ gị niile.

46 Aga m ekwupụta banyere ụkpụrụ gị nʼihu ndị eze

ma ihere agaghị eme m,

47 nʼihi na iwu gị na-amasị m

nʼihi na ahụrụ m ha nʼanya.

48 Ana m eweliri iwu gị niile aka elu, bụ ndị m hụrụ nʼanya,

ana m atụgharịkwa uche nʼiwu gị niile.

ז Zayin

49 Cheta okwu i nyere ohu gị,

nʼihi na i nyela m olileanya.

50 Nkasiobi m nʼime ịta ahụhụ m bụ nke a:

nkwa gị na-echebe ndụ m.

51 Ndị mpako na-akwa m emo na-esepụghị aka,

ma anaghị m esite nʼiwu gị wezuga onwe m.

52 O Onyenwe anyị, ana m echeta iwu gị niile, ndị dị site na mgbe ochie,

ha na-ewetara m nkasiobi.

53 Ana m ewe iwe nke ukwu nʼihi ndị ajọ omume,

ndị gbakụtara iwu gị azụ.

54 Iwu gị niile bụ isi okwu abụ m

ebe ọbụla m na-anọ.

55 Nʼabalị, o Onyenwe anyị, ana m echeta aha gị,

aga m edebekwa iwu gị.

56 Nke a bụrịị ihe m na-eme oge niile:

ana m erubere ụkpụrụ gị isi.

ח Het

57 O Onyenwe anyị, ị bụ ihe nketa m;

ekweela m nkwa irube isi nye okwu gị niile.

58 Ejirila m obi m niile chọọ ihu gị;

meere m ebere dịka nkwa gị si dị.

59 Echeela m echiche banyere ụzọ m niile,

chigharịakwa na-agbaso ụkpụrụ gị niile.

60 Aga m eme ngwangwa, agaghị atụfu oge

irubere iwu gị niile isi.

61 A sịkwarị na ndị ajọ omume ejiri ụdọ kee m agbụ,

agaghị m echefu iwu gị.

62 Nʼetiti abalị, aga m ebili nye gị ekele

nʼihi iwu gị niile ziri ezi.

63 Abụ m enyi ndị niile na-atụ egwu gị,

ndị niile na-agbaso ụkpụrụ gị.

64 O Onyenwe anyị, ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya gị;

kuziere m iwu gị niile.

ט Tet

65 Meere ohu gị ihe ọma

dịka okwu gị si dị, o Onyenwe anyị.

66 Zi m ihe ọmụma na ikpe ziri ezi

nʼihi na ekwenyere m nʼiwu gị niile.

67 Tupu m nwee nsogbu, a kpafuru m,

ma ugbu a, ana m erubere okwu gị isi.

68 I dị mma, ihe i na-eme ziri ezi;

kuziere m iwu gị niile.

69 Nʼagbanyeghị na ndị mpako a gbasaala okwu ụgha techie m,

ana m eji obi m niile na-edebe ụkpụrụ gị.

70 Obi ha siri ike, ọ dịghị ihe na-emetụta ha,

ma ana m enwe mmasị nʼiwu gị.

71 Ọ dị mma na m tara ahụhụ

ka m nwee ike mụta iwu gị niile.

72 Iwu si nʼọnụ gị pụta dị oke ọnụahịa nye m

karịa imerime puku ọlaọcha na ọlaedo.

י Yod

73 Aka gị kere m, kpụọkwa m;

nye m nghọta ka m mụta iwu gị niile.

74 Ka ndị na-atụ egwu gị ṅụrịa mgbe ha hụrụ m,

nʼihi na olileanya m dị nʼokwu gị.

75 O Onyenwe anyị, amaara m na iwu gị niile ziri ezi,

ọ bụkwa nʼikwesị ntụkwasị obi ka ị tara m ahụhụ.

76 Ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ kasịe m obi,

dịka nkwa i kwere ohu gị si dị.

77 Ka ọmịiko gị bịakwasị m, ka m nwee ike dị ndụ,

nʼihi na iwu gị na-amasị m.

78 Ka ihere mee ndị mpako nʼihi ihe ọjọọ ha mere m na-enweghị ihe m mere;

ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị.

79 Ka ndị niile na-atụ egwu gị bịakwute m,

ndị na-aghọta ụkpụrụ gị niile.

80 Ka m were obi zuruoke na-agbaso ụkpụrụ gị niile,

ka ihere ghara ime m.

כ Kap

81 Mkpụrụobi m na-ada mba site nʼọchịchọ ya maka nzọpụta gị,

ma olileanya m dị nʼokwu gị.

82 Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nkwa gị;

ana m asị, "Olee mgbe ị ga-akasị m obi?"

83 Nʼagbanyeghị na adị m ka karama akpụkpọ nke dị nʼanwụrụ ọkụ,

anaghị m echefu iwu gị niile.

84 Ruo olee mgbe ka ohu gị ga-anọgide na-eche?

Olee mgbe ka ị ga-ata ndị na-akpagbu m ahụhụ?

85 Ndị mpako na-egwuru m olulu,

bụ ihe nke na-adịghị ka iwu gị si dị.

86 Iwu gị niile kwesiri ntụkwasị obi;

nyere m aka, nʼihi na ndị mmadụ na-akpagbu m ma o nweghị ihe m mere ha.

87 Ọ fọdụrụ ntakịrị ihe, ha gaara ala m nʼiyi,

ma agbakụtaghị m ụkpụrụ gị azụ.

88 Site nʼịhụnanya gị nke na-adịgide chebe ndụ m,

ka m nwe ike rube isi nʼiwu nke ọnụ gị.

ל Lamed

89 O Onyenwe anyị, okwu gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;

ọ na-eguzosi ike nʼeluigwe.

90 Ikwesi ntụkwasị obi gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ;

ọ bụ gị kere ụwa, ọ na-eguzosikwa ike.

91 Ruo taa, iwu gị niile na-eguzosi ike,

nʼihi na ihe niile na-ejere gị ozi.

92 A sịkwarị na iwu gị anaghị amasị m,

agaara m anwụ nʼime nsogbu m.

93 Agaghị m echefu ụkpụrụ gị niile,

nʼihi na ọ bụ ha ka i ji chebe ndụ m.

94 Zọpụta m, nʼihi na abụ m nke gị;

achọpụtala m ụkpụrụ gị niile.

95 Ndị ajọ omume na-eche ịla m nʼiyi,

ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị.

96 Ana m ahụ nsọtụ ihe niile zuruoke,

ma iwu gị niile enweghị nsọtụ.

מ Mem

97 O, otu m si hụ iwu gị nʼanya!

Ana m atụgharị uche na ya ogologo ụbọchị niile.

98 Iwu gị na-eme ka amamihe m karịa nke ndị iro m,

ha na-anọnyere m oge niile.

99 Enwere m nghọta karịa ndị na-ezi m ihe,

nʼihi na ana m atụgharịa uche nʼiwu gị niile.

100 Enwere m nghọta karịa ndị okenye

nʼihi na ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi.

101 Ajụrụ m ajụ ije ije nʼụzọ ọjọọ ọbụla

ka m nwee ike rubere okwu gị isi

102 Ewezugaghị m onwe m nʼiwu gị niile,

nʼihi na ọ bụ gị onwe gị ziri m ha.

103 Lee ka okwu gị niile si atọ m ụtọ,

ha dị ụtọ nʼọnụ m karịa mmanụ aṅụ!

104 A na-enweta nghọta site nʼụkpụrụ gị niile;

ya mere ana m akpọ ụzọ ọjọọ ọbụla asị.

נ Nun

105 Okwu gị bụ oriọna dịrị ụkwụ m

bụrụkwa ìhè nʼụzọ m.

106 Aṅụọla m iyi, mee ka o guzosie ike,

na aga m agbaso iwu ezi omume gị niile.

107 Ataala m ahụhụ nke ukwuu;

chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka okwu gị si dị.

108 O Onyenwe anyị, nabata otuto afọ ofufu niile nke si nʼọnụ m,

kuziekwara m iwu gị niile.

109 Mkpụrụobi m na-adị m nʼọbụaka m oge niile,

ma echezọghị m iwu gị.

110 Ndị ajọ omume esielera m ọnya,

ma esitebeghị m nʼụkpụrụ gị kpafuo.

111 Iwu gị niile bụ ihe nketa m ruo mgbe ebighị ebi;

ha bụ ihe na-enye obi m ọṅụ.

112 Obi m ekpebiela idebe ụkpụrụ gị

ruo na ngwụcha.

ס Samek

113 Ana m akpọ ndị na-enwe obi abụọ asị,

ma ahụrụ m iwu gị nʼanya.

114 Ị bụ ebe mgbaba m na ọta m;

olileanya m dị nʼokwu gị.

115 Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-eme ihe ọjọọ,

ka m nwee ike idebe iwu niile nke Chineke m!

116 Gbaa m ume dịka nkwa gị si dị, aga m adịkwa ndụ;

ekwekwala ka olileanya m daa.

117 Kwagide m, aga m abụ onye a gbapụtara;

aga m anọgide na-asọpụrụ iwu gị niile.

118 Ị na-ajụ ndị niile na-adịghị edebe iwu gị,

nzube aghụghọ ha niile bụ ihe na-enweghị isi.

119 Ị na-ekpochapụ ndị ajọ omume dịka unyi a na-ekpofu ekpofu;

nʼihi ya, ahụrụ m ụkpụrụ gị niile nʼanya.

120 Anụ ahụ m na-ama jijiji nʼihi ịtụ egwu gị;

ana m eguzo nʼoke egwu nʼihi iwu gị niile.

ע Ayin

121 Emeela m ihe dị mma na ihe ziri ezi;

ahapụkwala m nʼaka ndị na-emegbu m.

122 Kwee ohu gị nkwa na ị ga-elekọta ya;

ekwela ka ndị mpako kpagbuo m.

123 Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nzọpụta gị

ebe m na-ele anya nkwa gị ziri ezi.

124 Biko mesoo ohu gị mmeso dịka ịhụnanya gị si dị

ma kuziekwara m ụkpụrụ gị niile.

125 Abụ m ohu gị, nye m nghọta,

ka m nwee ike mara ụkpụrụ gị niile.

126 O Onyenwe anyị, oge eruola mgbe ị ga-arụ ọrụ,

nʼihi na a na-emebi iwu gị.

127 Nʼihi na ahụrụ m iwu gị niile nʼanya

karịa ọlaedo, e karịa ọlaedo a nụchara anụcha,

128 nʼihi na m na-ahụta ụkpụrụ gị niile ka ihe ziri ezi,

akpọrọ m ụzọ niile na-ezighị ezi asị.

פ Pe

129 Iwu gị niile dị ịtụnanya;

ya mere, ana m erubere ha isi.

130 Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè;

ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe.

131 Ana m asaghe ọnụ m na-ekupụ ume ike ike,

na-achọsi iwu gị niile ike.

132 Chee m ihu, meere m ebere,

dịka i si emere ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ebere.

133 Mee ka nzọ ụkwụ m niile na-aga dịka okwu gị si dị;

ekwela ka mmehie chịa m.

134 Gbapụta m site nʼaka ndị na-emegbu m,

ka m nwee ike debe iwu gị.

135 Mee ka ihuọma gị dịkwasị nʼahụ ohu gị.

Kuziere m ụkpụrụ gị niile.

136 Anya mmiri akwa na-agba m nke ukwuu

nʼihi na ndị mmadụ adịghị erube isi nye iwu gị.

צ Tsade

137 O Onyenwe anyị, ị bụ onye ezi omume,

iwu gị niile zikwara ezi.

138 Ụkpụrụ gị niile ziri ezi;

ha kwesiri ntụkwasị obi.

139 Nʼihi na ndị iro m na-elefu okwu gị anya,

ịnụ ọkụ nʼobi m na-ada mba.

140 Nkwa gị niile bụ ihe enyochara nke ọma,

ohu gị na-ahụkwa ha nʼanya.

141 Ọ bụ ezie na m bụ onye dị ala, na onye a na-eleda anya,

ma adịghị m eleda ụkpụrụ gị niile anya.

142 Ezi omume gị na-adị ruo mgbe ebighị ebi.

Iwu gị niile bụkwa eziokwu.

143 Nsogbu na ihe mgbu adakwasịla m,

ma iwu gị niile bụ ihe na-amasị m.

144 Iwu gị niile bụ ezi omume ruo mgbe ebighị ebi;

nye m nghọta, ka m nwe ike dị ndụ.

ק Kwof

145 Eji m obi m niile na-akpọ oku; zaa m o Onyenwe anyị,

aga m erubekwa isi nye ụkpụrụ gị niile.

146 Ana m akpọku gị; zọpụta m

aga m erube isi nye ụkpụrụ gị niile.

147 Tupu chị na-abọ, ana m ebili, na-akwa akwa maka enyemaka;

olileanya m dị nʼokwu gị.

148 Ana m amụ anya abalị nʼelu ihe ndina m,

nʼihi ịtụgharị uche na nkwa gị niile.

149 Nụrụ olu m dịka ịhụnanya gị si dị;

chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka iwu gị niile si dị.

150 Ndị na-atụpụta atụmatụ ọjọọ nọ nso

ma ha nọ iwu gị niile nʼebe dị anya.

151 Ma ị nọ nso, Onyenwe anyị;

ihe niile i nyere nʼiwu bụ eziokwu.

152 Site na mgbe ochie ka m mụtara site nʼụkpụrụ gị,

na i mere ka ha guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.

ר Resh

153 Ledata anya ka ị hụ ịta ahụhụ m ma gbapụta m,

nʼihi na echefughị m iwu gị.

154 Kpepụta m, gbapụta m,

chebe ndụ m dịka nkwa gị si dị.

155 Nzọpụta dị anya nʼebe ndị na-eme ihe ọjọọ nọ,

nʼihi na ha anaghị agbaso ụkpụrụ gị niile.

156 O Onyenwe anyị, ọmịiko gị dị ukwuu;

chebe ndụ m dịka iwu gị niile si dị.

157 Ndị iro m na ndị na-akpagbu m dị ọtụtụ,

ma aga m anọgide na-edebe iwu gị.

158 Ana m asọ ndị niile na-enweghị okwukwe nʼime gị oyi,

nʼihi na ha anaghị erubere okwu gị isi.

159 Lee ka m si hụ ụkpụrụ gị niile nʼanya;

chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka ịhụnanya gị si dị.

160 Okwu gị niile bụ eziokwu;

iwu gị niile ziri ezi na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

ש Sin na Shin

161 Ndịisi na-emegbu m na-enweghị ihe m mere,

ma obi m na-ama jijiji nʼihi okwu gị.

162 Ana m aṅụrị ọṅụ nʼime nkwa gị

dịka onye chọtara ọtụtụ ihe nkwata nʼagha.

163 Akpọrọ m okwu ụgha asị, ọ bụkwa ihe arụ nʼebe m nọ,

ma ahụrụ m iwu gị nʼanya.

164 Aga m eto gị ugboro asaa nʼụbọchị,

nʼihi iwu gị ziri ezi.

165 Ndị hụrụ iwu gị nʼanya nwere udo dị ukwuu,

ọ dịghị ihe ga-eme ka ha sụọ ngọngọ.

166 Ana m echere nzọpụta gị, o Onyenwe anyị,

na-agbasokwa iwu gị niile.

167 Ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi

nʼihi na m hụrụ ha nʼanya nke ukwuu.

168 Ana m erubere ụkpụrụ na iwu gị niile isi,

nʼihi na ị maara ụzọ m niile.

ת Taw

169 Ka akwa m ruo gị ntị, o Onyenwe anyị;

nye m nghọta dịka okwu gị si dị.

170 Ka arịrịọ m ruo gị ntị;

gbapụta m dịka nkwa gị si dị.

171 Ka ọnụ m jupụta nʼotuto,

nʼihi na ị na-ezi m iwu gị niile.

172 Ka m jiri ire m bụọ abụ banyere okwu gị,

nʼihi na iwu gị niile ziri ezi.

173 Nọọ na njikere oge niile inyere m aka,

nʼihi na ahọrọla m ụkpụrụ gị niile.

174 Ana m ele anya nzọpụta gị, o Onyenwe anyị,

iwu gị bụ ihe na-amasị m.

175 Kwere ka m dịrị ndụ ka m nwee ike ito gị,

ka iwu gị niile gbaa m ume.

176 Akpafuola m dịka atụrụ nke furu efu,

chọọ ohu gị,

nʼihi na echefubeghị m iwu gị niile.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-