Publicidade

Salmos 111

Toonu Onyenwe anyị

1 Toonu Onyenwe anyị!

Aga m eji obi m niile jaa Onyenwe anyị mma

nʼime nzukọ ndị ụzọ ha ziri ezi na nʼime ọgbakọ ukwuu.

2 Ọrụ niile Onyenwe anyị na-arụ dị ukwuu;

ndị niile na-enwe mmasị na ha na-atụgharị uche nʼime ha.

3 Ọrụ ya jupụtara nʼebube na ịma mma,

ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.

4 O meela ka e cheta ọrụ ebube ya niile;

Onyenwe anyị bụ onye amara na onye ọmịiko.

5 Ọ na-egboro ndị na-atụ egwu ya mkpa ihe oriri;

ọ na-echetakwa ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi.

6 O gosila ndị ya ike nke ọrụ ya niile,

site nʼinye ha ala niile nke ndị mba ọzọ.

7 Ọrụ aka ya niile bụ ihe kwesiri ekwesi na ikpe ziri ezi;

ụkpụrụ ya niile bụ ihe kwesiri ntụkwasị obi.

8 E hiwere ha ịdị ruo mgbe niile ebighị ebi,

ha bụ ihe e mere nʼikwesị ntụkwasị obi na izi ezi.

9 O wetaara ndị ya mgbapụta;

o meela ka ọgbụgba ndụ ya guzosie ike ruo ebighị ebi,

aha ya dị nsọ dịkwa oke egwu.

10 Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe;

ndị niile na-edebe ụkpụrụ ya nwere ezi nghọta.

Otuto ya na-adị ruo mgbe ebighị ebi.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-