Pular para o conteúdo
Publicidade

Abụ Ọma 110

Abụ Ọma Devid.

Onyenwe anyị na onye ya o tere mmanụ

1 Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị ya:

"Nọdụ ala nʼaka nri m

ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị

ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị."110:1 Nʼoge ochie, a na-arụ ocheeze nʼebe dị elu, ma nwee ihe nrigo e ji arịgoru ya. Mgbe ahụ, ndị eze na-achịkwasa ụkwụ ha nʼolu ndị ha meriri nʼagha, Mat 22:44; Mak 12:36; Luk 20:42-43; Hib 1:13; 1Kọ 15:25.

2 Onyenwe anyị ga-eme ka ike ọchịchị gị site na Zayọn ruo ala ndị ọzọ;

ga-achị nʼetiti ndị iro gị niile.

3 Nʼụbọchị ga-ebu agha,

ndị agha gị niile ga-ahọrọ nʼonwe ha i soro gị.

Ndị yikwasịrị ịma mma nke ịdị nsọ ka uwe,

bụ ụmụ okorobịa gị ga-abịakwute gị

dịka igirigi site nʼafọ ụtụtụ.

4 Onyenwe anyị aṅụọla iyi,

gaghị agbanwe uche ya:

"Gị onwe gị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi,

nʼusoro Melkizedek."

5 Onyenwe anyị nọ nʼaka nri gị.

ga-egwepịa ndị eze nʼụbọchị oke iwe ya.

6 ga-ekpe mba niile ikpe, na-atụkọta ndị nwụrụ anwụ,

ma gwepịa ndị na-achị achị nʼelu ụwa niile.

7 ga-aṅụ mmiri site nʼiyi nta nke dị nʼakụkụ ụzọ;

nʼihi nke a, ga-eweli isi ya elu.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também