Publicidade

Salmos 110

Abụ Ọma Devid.
Onyenwe anyị na onye ya o tere mmanụ

1 Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị ya:

"Nọdụ ala nʼaka nri m

ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị

ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị."

2 Onyenwe anyị ga-eme ka ike ọchịchị gị site na Zayọn ruo ala ndị ọzọ;

ị ga-achị nʼetiti ndị iro gị niile.

3 Nʼụbọchị ị ga-ebu agha,

ndị agha gị niile ga-ahọrọ nʼonwe ha i soro gị.

Ndị yikwasịrị ịma mma nke ịdị nsọ ka uwe,

bụ ụmụ okorobịa gị ga-abịakwute gị

dịka igirigi site nʼafọ ụtụtụ.

4 Onyenwe anyị aṅụọla iyi,

ọ gaghị agbanwe uche ya:

"Gị onwe gị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi,

nʼusoro Melkizedek."

5 Onyenwe anyị nọ nʼaka nri gị.

Ọ ga-egwepịa ndị eze nʼụbọchị oke iwe ya.

6 Ọ ga-ekpe mba niile ikpe, na-atụkọta ndị nwụrụ anwụ,

ma gwepịa ndị na-achị achị nʼelu ụwa niile.

7 Ọ ga-aṅụ mmiri site nʼiyi nta nke dị nʼakụkụ ụzọ;

nʼihi nke a, ọ ga-eweli isi ya elu.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-