Publicidade

Salmos 92

Abụ Ọma. Abụ maka ụbọchị izuike.
Ekele maka ịdị mma Chineke

1 Ọ bụ ihe ziri ezi ito Onyenwe anyị,

na iti egwu nye aha gị, gị Onye kachasị ihe niile elu,

2 ikwupụta ịhụnanya gị nʼụtụtụ,

na ikwesi ntụkwasị obi gị nʼabalị,

3 jiri ihe iti egwu ụbọ akwara

na une bụọrọ gị abụ dị ụtọ.

4 Nʼihi na ị na-eme ka obi dị m ụtọ, site nʼọrụ gị niile, o Onyenwe anyị,

Ọ bụ ya mere m ji na-abụ abụ ọṅụ.

5 Lee ka ọrụ gị si dị ukwuu, Onyenwe anyị.

Leekwa ụdị echiche miri emi ị na-eche.

6 Ndị uche kọrọ amaghị nke a,

ndị nzuzu enweghị nghọta,

7 ọ bụ ezie na ndị ajọ omume na-etopụta dịka ahịhịa

ndị na-emekwa ajọ ihe na-eto na-awasa,

a ga-ala ha nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi.

8 Ma gị, O Onyenwe anyị, bụ onye e buliri elu ruo mgbe ebighị ebi.

9 Nʼezie, ndị iro gị niile, Onyenwe anyị,

e ndị iro gị niile ga-ala nʼiyi;

ndị niile na-eme ajọ ihe ka a ga-achụsasị.

10 I meela ka mpi m dị elu dịka oke ehi na-akpa ike;

awụsala m mmanụ dị mma.

11 Ejirila m anya m abụọ hụ ka e meriri ndị iro m;

ejirila m ntị m nụ maka ịla nʼiyi nke ndị iro m afọ tara mmiri.

12 Ma ndị ezi omume ga-awa igu dịka osisi nkwụ;

ha ga-ebukwa ibu dịka osisi ukwu sida nke Lebanọn,

13 nke a kụrụ nʼime ụlọ Onyenwe anyị,

ha ga-eto, wasaakwa nʼime ogige Chineke anyị.

14 Ha ga-amị mkpụrụ, ọ bụladị mgbe ha mere agadi.

Ha ga-ejupụtakwa nʼahịhịa ndụ,

15 na-ekwupụta, "Onyenwe anyị bụ Onye ziri ezi;

ọ bụ Oke Nkume m, ọ dịkwaghị ajọ omume dị nʼime ya."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-