Publicidade

Salmos 51

Abụ dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Mgbe Netan bụ onye amụma bịakwutere Devid nʼoge ya na Batsheba kwara iko.
Ekpere maka mgbaghara mmehie

1 O Chineke, meere m ebere,

nʼihi ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide;

nʼihi oke ọmịiko gị,

hichapụ njehie m niile.

2 Sachapụ mmehie m niile,

ma mee m ka m dị ọcha.

3 Nʼihi na amaara m njehie m niile,

mmehie m dịkwa nʼihu m mgbe niile.

4 Ọ bụkwa naanị gị ka m mehiere megide,

mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị,

nke mere na ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe ị na-ekwu okwu,

na onye ezi omume mgbe ị na-ekpe ikpe.

5 Nʼezie, onye mmehie ka m bụ site nʼoge amụrụ m;

bụrụkwa onye mmehie site nʼoge nne m tụrụ ime m.

6 Nʼezie, ị na-achọ eziokwu nʼakụkụ niile zoro ezo;

ị na-akụziri m amamihe nʼakụkụ niile zoro ezo.

7 Were hisọp sachaa m, aga m adị ọcha;

sachaa m ka m dị ọcha karịa snoo.

8 Mee ka m nụrụ olu obi ụtọ na ọṅụ;

ka okpukpu ndị i gwepịara ṅụrịkwaa.

9 Zopu ihu gị nʼebe mmehie m niile dị,

hichapụkwa mmehie m niile.

10 Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke,

nwogharịa ezi mmụọ nʼime m.

11 Achụpụla m nʼihu gị,

anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị.

12 Nyeghachikwa m ọṅụ nke nzọpụta gị,

ma jiri ezi mmụọ kwagide m.

13 Mgbe ahụ, aga m enwe ike izi ndị njehie ụzọ gị,

ndị mmehie ga-echegharị lọghachikwute gị.

14 O Chineke, zọpụta m site nʼikpe ọmụma nke mwụfu ọbara,

Chineke, gị bụ Chineke Onye nzọpụta m,

ire m ga-abụ abụ banyere ezi omume gị.

15 O, Onyenwe m, meghee ọnụ m,

ka m kwupụta otuto gị.

16 Ị naghị enwe mmasị nʼaja, ma ọ bụghị ya, agaara m eweta ya.

Ị naghị enwe mmasị nʼaja nsure ọkụ.

17 Aja Chineke chọrọ bụ mmụọ tiwara etiwa,

O Chineke, ị naghị elefu anya,

nʼobi tiwara etiwa na nke nwere ezi nchegharị.

18 Ka ọ masị gị inye Zayọn ọganihu;

i wulie mgbidi niile nke Jerusalem.

19 Mgbe ahụ, a ga-enwe ezi aja,

aja nsure ọkụ nke ga-atọ gị ụtọ;

mgbe ahụ, a ga-achụkwa aja ọtụtụ oke ehi nʼelu ebe ịchụ aja gị.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-