Publicidade

Salmos 15

Abụ Ọma Devid.
Onye ga-ebi nʼugwu nsọ Onyenwe anyị?

1 Onyenwe anyị, onye pụrụ ịnọgide nʼụlọnsọ ukwu gị?

Onye pụrụ ibi nʼugwu nsọ gị?

2 Onye na-ebi ndụ nke na-enweghị ịta ụta,

onye na-arụ ọrụ ezi omume,

onye na-ekwu eziokwu site nʼobi ya.

3 Onye jụrụ ikwutọsị ndị ọzọ,

onye na-adịghị eme onye agbataobi ya ihe ọjọọ,

na onye na-adịghị ekwulu mmadụ ibe ya,

4 onye na-eleda onye ajọ omume anya,

ma na-asọpụrụ ndị ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị,

onye na-adịghị agbanwe nkwa ọbụla o kwere,

ọ bụladị mgbe nkwa ahụ na-emegide ya,

5 onye na-agbazinye mmadụ ego na-anaghị ụma,

onye na-adịghị a nara ngarị imegide onye aka ya dị ọcha.

Onye na-eme ihe ndị a

agaghị ama jijiji nʼọnọdụ ya, mgbe ọbụla.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-