Publicidade

Salmos 132

Abụ nrigo.
Devid na igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị

1 O Onyenwe anyị, cheta Devid,

nʼihe niile bụ ndị ọ gbakụtara azụ.

2 Ọ ṅụrụ iyi nye Onyenwe anyị,

kwee nkwa nye Onye dị ukwuu nke Jekọb:

3 "Agaghị m abanye nʼime ụlọ m

maọbụ rigoo nʼihe ndina m,

4 agaghị m arahụ ụra,

egbugbere anya m agaghị atụ oru ụra,

5 tutu ruo mgbe m chọtaara Onyenwe anyị ọnọdụ

ebe obibi nye Onye dị ukwuu nke Jekọb."

6 Anyị nụrụ ihe banyere ya nʼEfrata,

anyị chọtara ya nʼubi niile nke Jearim.

7 "Ka anyị gaa na-ebe obibi ya;

ka anyị kpọọ isiala nʼebe ihe mgbakwasị ụkwụ ya.

8 ‘Bilie, Onyenwe anyị, bata nʼebe izuike gị,

gị na igbe ọgbụgba ndụ nke ike gị.

9 Ka ndị nchụaja gị yiri ezi omume gị dịka uwe;

ka ndị gị kwesiri ntụkwasị obi bụọ abụ nʼihi ọṅụ.’ "

10 Nʼihi ohu gị, bụ Devid,

agbakụtala onye gị e tere mmanụ azụ.

11 Onyenwe anyị ṅụrụ Devid iyi nʼeziokwu,

bụ iyi nke ọ gaghị esi na ya laghachi azụ:

"Otu nʼime ụmụ gị,

ka m ga-eme ka ọ nọdụ nʼocheeze gị,

12 ọ bụrụ na ụmụ ndị ikom gị edebe ọgbụgba ndụ m

na ụkpụrụ niile m kuziri ha,

mgbe ahụ ụmụ ha ga-anọdụ ala

nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi."

13 Nʼihi na Onyenwe anyị ahọrọla Zayọn,

ọ bụ ọchịchọ obi ya ime ya ebe obibi ya;

14 "Ebe a bụ ebe izuike m ruo mgbe ebighị ebi,

ebe a ka ocheeze m ga-adịkwa, nʼihi na ọ bụ ihe m chọrọ.

15 Aga m eji ọtụtụ nri dị iche iche gọzie ya;

aga m eji nri mee ka afọ ju ndị ogbenye ya.

16 Aga m eji nzọpụta yinye ndị nchụaja ya niile dịka uwe,

ndị nsọ ya ga-abụ abụ nʼihi ọṅụ.

17 "Nʼebe a ka m ga-eme ka mpi puputara Devid

ma debekwa oriọna nʼihi onye m e tere mmanụ.

18 Aga m eyikwasị ndị iro ya ihere dịka uwe

ma aga eji okpueze mara mma chọọ isi ya mma."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_09-43-29-