Publicidade

Salmos 84

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ Ọma ụmụ Kora nʼusoro gittit.
Agụụ nke ụlọnsọ Chineke

1 Lee ka ebe obibi gị sị maa mma,

O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile!

2 Ọ na-agụsị mkpụrụobi m agụụ ike, e mkpụrụobi m na-adakwa mba,

ịbata nʼogige Onyenwe anyị;

mkpụrụobi m na anụ ahụ m na-eti mkpu

na-achọ Chineke dị ndụ.

3 Ọ bụladị ụmụ nnụnụ nta nke eluigwe, achọtala ebe obibi;

eleke achọtakwarala onwe ya akwụ,

ebe ọ ga na-edebe ụmụ ya,

nʼakụkụ ebe ịchụ aja nsọ gị,

O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Eze m na Chineke m.

4 Ndị a gọziri agọzi ka ndị bi nʼụlọ gị bụ;

ha na-eto gị mgbe niile. Sela

5 Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ike ha nwere dị na gị,

ndị kpebiri nʼobi ha ịga njem.

6 Mgbe ha na-esite na Ndagwurugwu Baka na-agafe,

ha na-eme ya ka ọ bụrụ ebe isi iyi dị iche iche na-asọpụta;

mmiri ozuzo mbụ na-ewere ngọzị niile kpuchie ya.

7 Ike ha na-abawanye abawanye,

tutu ha niile nʼotu na otu, abịa guzo nʼihu Chineke na Zayọn.

8 O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nụrụ ekpere m.

Gee m ntị, gị Chineke nke Jekọb.

9 Lekwasị anya nʼọta anyị, O Chineke,

jiri ihuọma lekwasị onye gị e tere mmanụ anya.

10 Otu mkpụrụ ụbọchị a nọrọ nʼime ogige gị,

karịrị puku ụbọchị a nọrọ ebe ọzọ;

ọ ga-akara m mma ịbụ onye nche nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ Chineke m,

karịa ibi nʼụlọ ikwu nke ndị ajọ omume.

11 Onyenwe anyị Chineke bụ anyanwụ na ọta;

Onyenwe anyị na-enye ihuọma na nsọpụrụ;

ọ naghị egbochi ihe ọma ọbụla

site nʼebe ndị na-eje ije nʼizuoke nọ.

12 O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,

ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụkwasị gị obi.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-