Publicidade

Salmos 101

Abụ Ọma Devid.
Nkwa eze

1 Aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị na ikpe gị ziri ezi;

o Onyenwe anyị, ọ bụ gị ka m ga-abụku abụ otuto.

2 Aga m enwe uche ị hụ na m biri ndụ na-enweghị ịta ụta ọbụla,

olee mgbe ị ga-abịakwute m?

Aga m ejikwa obi nke a na-agaghị ata ụta ọbụla

jegharịa nʼime ụlọ m.

3 Agaghị m edo ihe jọgburu onwe ya

nʼihu m.

Ana m akpọ ọrụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi asị.

Agaghị m enwekwa oke nʼime ya.

4 Ndị obi ha gbagọrọ agbagọ agaghị anọ m nso.

Agakwaghị m etinye aka nʼọrụ ọjọọ ọbụla.

5 Onye ọbụla na-ekwulu onye agbataobi ya na nzuzo,

onye ahụ ka m ga-emechi ọnụ;

agaghị m anabata

onye ọbụla dị mpako ma nwee obi nganga.

6 Aga m elekwasị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼala a anya,

ka mụ na ha biri;

onye ahụ na-eje ije na-enweghị ịta ụta ọbụla

ga-ejere m ozi.

7 Onye ọbụla na-aghọ aghụghọ

agaghị ebi nʼụlọ m;

onye ọbụla na-ekwu okwu ụgha

agaghị eguzokwa nʼihu m.

8 Ụtụtụ niile ka m na-eme ka ha dere duu

bụ ndị ajọ omume niile nọ nʼala a;

Aga m ebipụ ndị niile na-eme ajọ ihe

site nʼobodo Onyenwe anyị.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-