Publicidade

Salmos 27

Abụ Ọma Devid.
Abụ nke iguzosi ike

1 Onyenwe anyị bụ ìhè m na nzọpụta m,

onye ka m ga-atụ egwu ya?

Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m,

ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu?

2 Mgbe ndị na-eme ihe ọjọọ busoro m agha

ka ha ripịa anụ ahụ m,

ọ bụ ndị iro m na ndị kpọrọ m asị,

bụ ndị ga-asọ ngọngọ ma dakwaa.

3 Ọ bụrụ na usuu ndị agha agbaa m gburugburu,

obi m agaghị atụ ụjọ ọbụla;

ọ bụladị na agha adaa imegide m,

nʼoge ahụ, ka m ga-enwe ntụkwasị obi.

4 Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị,

nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike;

ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị

ụbọchị niile nke ndụ m,

na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị,

na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya.

5 Nʼihi na nʼụbọchị nsogbu,

ọ ga-echebe m nʼime ebe obibi ya;

ọ ga-ezo m nʼime ụlọ ikwu ya;

ma bulie m elu, debe m nʼelu oke nkume.

6 Mgbe ahụ, a ga-eweli isi m elu

karịa ndị iro m gbara m gburugburu;

aga m eji iti mkpu ọṅụ, chụọ aja nʼụlọ ikwu ya;

aga m abụ abụ, kụọ egwu nye Onyenwe anyị.

7 Gee ntị mgbe m na-akpọku gị Onyenwe anyị.

Meere m ebere, zaa m.

8 Obi m na-ekwu banyere gị, "Chọọ ihu ya!"

Ihu gị, Onyenwe anyị, ka m ga-achọ.

9 Ezonarịla m ihu gị,

agbakụtala ohu gị azụ nʼiwe;

nʼihi na ị bụrịị onye inyeaka m.

O Chineke, Onye nzọpụta m,

ahapụkwala m.

10 Ọ bụrụrị na nne na nna m ahapụ m,

Onyenwe anyị ga-anabata m.

11 Zi m ụzọ gị, O Onyenwe anyị;

duo m nʼụzọ kwesiri

nʼihi ndị na-akpagbu m.

12 Ararala m nyefee nʼaka ndị kpọrọ m asị nʼihi ọchịchọ ha,

ọtụtụ ndị ama ụgha ebiliela imegide m,

ha na-ekupụ ihe ike dịka ume.

13 Olileanya m bụ nke a:

Aga m ahụ ịdị mma Onyenwe anyị

nʼala ndị dị ndụ.

14 Chere Onyenwe anyị;

dịrị ike, nwekwaa ume,

ma chere Onyenwe anyị.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-