Publicidade

Salmos 118

Kelee Onyenwe anyị

1 Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na dị mma;

ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

2 Ka ụmụ Izrel kwupụta nʼonwe ha sị,

"Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi."

3 Ka ndị ezinaụlọ Erọn kwuokwa sị,

"Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi."

4 Ka ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị kwuo sị,

"Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi."

5 Nʼọnọdụ oke ihe mgbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị,

zara m, mee ka m nwere onwe m.

6 Onyenwe anyị nọnyeere m, agaghị m atụ egwu.

Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?

7 Onyenwe anyị nọnyere m; bụ onye na-enyere m aka.

Aga m ele ndị iro m anya na mmeri.

8 kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị

karịa ịtụkwasị ụmụ mmadụ obi.

9 kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị

karịa ịtụkwasị ndị amara aha ha obi.

10 Mba niile gbara m gburugburu

ma site nʼaha Onyenwe anyị aga m ala ha nʼiyi.

11 Ha gbara m gburugburu,

ma site nʼaha Onyenwe anyị ka m na-egbuda ha.

12 Ha gbara m gburugburu dịka aṅụ,

ma e menyụọla ha dịka ogwu na-ere ọkụ;

site nʼaha Onyenwe anyị, ka m na-egbuda ha.

13 Akwaghachiri m azụ, agaara m ada,

ma Onyenwe anyị nyere m aka.

14 Onyenwe anyị bụ ike m na abụ m;

ghọọla nzọpụta m.

15 Olu iti mkpu ọṅụ na mmeri

na-ada nʼime ụlọ ikwu ndị ezi omume:

"Aka nri Onyenwe anyị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!

16 Aka nri Onyenwe anyị bụ ihe e weliri elu;

aka nri Onyenwe anyị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!"

17 Agaghị m anwụ,

kama aga m adị ndụ kwusaara ndị ọzọ ọrụ ebube Onyenwe anyị rụrụ.

18 Onyenwe anyị tara m ahụhụ nke ukwuu,

ma o nyefeeghị m nʼaka ọnwụ.

19 Megheere m ọnụ ụzọ ama nke ezi omume;

aga m abanye nye Onyenwe anyị ekele.

20 Nke a bụ ọnụ ụzọ ụlọnsọ Onyenwe anyị,

ebe ndị ezi omume ga-esite na ya banye.

21 Aga m enye gị ekele, nʼihi na zara m;

ghọọla nzọpụta m.

22 Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ,

aghọọla nkume isi ntọala ụlọ;

23 nke a bụ ọrụ aka Onyenwe anyị,

bụkwa ihe ịtụnanya nʼanya anyị.

24 Nke a bụ ụbọchị Onyenwe anyị anyị mere,

ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime ya.

25 O Onyenwe anyị, zọpụta anyị;

o Onyenwe anyị, mee ka ihe gaara anyị nke ọma.

26 Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị.

Anyị sitere nʼụlọ Onyenwe anyị na-agọzi gị.

27 Onyenwe anyị bụ Chineke,

bụ ya mere ka ìhè ya mụkwasị anyị.

Chịrị igu nkwụ nʼaka gị, soro ndị ji ọṅụ bata nʼogige Chineke

bịaruo nʼebe ịchụ aja.

28 bụ Chineke m, aga m eto gị;

bụ Chineke m, aga m ebuli gị elu.

29 Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na dị mma,

ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-28_14-13-17-