Publicidade

Salmos 104

Toonu Chineke onye okike

1 Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị.

O Onyenwe anyị na Chineke m, ị dị ukwu nke ukwuu;

ị na-eyikwasị ịma mma na ebube dịka uwe.

2 Ọ na-eji ìhè kpuchie onwe ya dịka akwa;

ọ na-agbasa eluigwe dịka ụlọ ikwu

3 na-atọ ntọala ụlọ elu ya nʼelu mmiri.

Ọ na-eji igwe ojii emere onwe ya ụgbọ agha

na-ejirikwa nku nke ifufe felie elu.

4 O ji oke ifufe mere ihe na-ejere ya ozi,

meekwa ka ọkụ na-enwu enwu bụrụ ndị na-ejere ya ozi.

5 Ọ bụ ya tọrọ ntọala ụwa;

agaghị ewezugakwa ya site nʼọnọdụ ya.

6 I gbokwasịrị ogbu mmiri nʼelu ya dịka ọ bụ uwe ka i yikwasịrị ya,

mmiri tokpukwara ugwu niile.

7 Ma mgbe ị bara mba, mmiri ahụ gbapụrụ,

nʼụda oke olu nke egbe eluigwe gị, ha gbapụrụ ọsọ.

8 Ha sitere nʼelu ugwu niile,

sọrọ gaa na ndagwurugwu,

ruokwa nʼebe ahụ ị kpara oke na ha ga-anọ.

9 Ị kpara oke nye ha, nke ha na-agaghị agafe,

gbochie ha ikpuchi elu ụwa ọzọ.

10 Ọ na-eme ka mmiri, site nʼala na-asọpụta na ndagwurugwu,

meekwa ka iyi niile site nʼetiti ugwu na-asọfe.

11 Ha na-enye anụ ọhịa niile mmiri ọṅụṅụ

bụrụkwa ebe akpịrị ịkpọ nkụ nke ịnyịnya ibu ọhịa na-adajụ.

12 Nʼosisi dị nʼakụkụ ha ka ụmụ anụ ufe nke eluigwe ga-anọ wuo akwụ ha;

nọrọkwa nʼalaka ha bụọ abụ.

13 Ọ na-esite nʼeluigwe na-ezidata mmiri ozuzo nʼelu ugwu niile;

ụwa niile na-ejupụtakwa na mkpụrụ nke ọrụ aka ya.

14 Ọ na-eme ka ahịhịa puputara anụ ụlọ,

na-emekwa ka ihe a kụrụ nʼala puoro mmadụ nʼubi ya,

ime ka nri site nʼala pupụta;

15 mmanya nke na-enye obi mmadụ aṅụrị,

mmanụ nke na-eme ka ihu na-egbupụ amụma,

na achịcha nke na-enye ya ume nʼobi.

16 A na-agba osisi niile nke Onyenwe anyị mmiri nke ọma,

osisi sida nke Lebanọn nke ọ kụrụ.

17 Ụmụ nnụnụ na-ewu akwụ ha;

nʼosisi fịa ka ụgbala na-ewu akwụ ya.

18 Ugwu niile dị elu dịịrị ewu ọhịa;

nʼọgba dị na nkume ka ewi nkume na-ezo onwe ha.

19 I mere ọnwa ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-agụ oge na mgbe dị iche iche;

anyanwụ makwaara mgbe ọ ga-eji daa.

20 Ị na-eme ka ọchịchịrị bịa, ọ bụrụ abalị;

ụmụ anụ ọhịa niile nke oke ọhịa na-akpagharị.

21 Ụmụ ọdụm na-agbọ ụja ha na-elegharị anya anụ ha ga-adọgbu,

ịchọrọ onwe ha ihe oriri ahụ Chineke na-enye ha.

22 Nʼisi ụtụtụ mgbe anwụ wara,

ha na-alaghachi zoo onwe ha nʼebe nzuzo ha.

23 Ụmụ mmadụ na-amalitekwa ọrụ ha nʼisi ụtụtụ,

kwụsịkwa nʼanyasị mgbe ọchịchịrị bidoro ịgba.

24 Onyenwe anyị, ọrụ aka gị dị ọtụtụ.

Ọ bụ site nʼamamihe ka i ji kee ha.

Elu ụwa niile jupụtara nʼihe niile i kere eke.

25 Leenụ osimiri nke buru ibu saakwa mbara;

jupụtara nʼihe e kere eke na-akpụ akpụ nke a na-apụghị ịgụta ọnụ bi,

anụ dị ndụ ma ndị ukwu ma ndị nta.

26 Nʼebe ahụ ka ụgbọ mmiri niile na-ejegharị,

nʼime ya kwa ka leviatan, nke gị onwe gị kere, na-anọ egwuri egwu.

27 Ha niile na-adabere na gị,

ka i nye ha nri nʼotu nʼotu, mgbe oge iri nri ha ruru.

28 Ị na-enye ha nri;

ha na-erikwa ya.

Mgbe i meghere ọbụ aka gị nye ha nri,

afọ na-eju ha nke ọma.

29 Mgbe i zonarịrị ha ihu gị,

egwu na-eju ha obi.

Mgbe ị napụkwara ha ume ndụ i nyere ha,

ha na-ekubi ume, nwụọ, laghachikwa nʼaja ebe ha siri pụta.

30 Mgbe i zipụrụ mmụọ gị,

a na-eke ha;

ị na-agbanwekwa ihu elu ụwa.

31 Ka ebube Onyenwe anyị dịgide site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi;

ka ọrụ aka Onyenwe anyị niile wetara ya ọṅụ,

32 onye na-ele ụwa anya, ụwa amaa jijiji,

onye na-emetụ ugwu niile aka, ha na-akwụ anwụrụ ọkụ.

33 Aga m abụku Onyenwe anyị abụ ogologo ụbọchị niile nke ndụ m;

aga m abụku Chineke m abụ otuto oge niile m na-adị ndụ.

34 Ka ntụgharị uche m niile bụrụ ihe na-atọ ya ụtọ,

dịka m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.

35 Ka e kpochapụ ndị mmehie niile site nʼụwa.

Ka ndị niile na-emebi iwu gharakwa ịdị ọzọ.

Too Onyenwe anyị gị mkpụrụobi m!

Toonu Onyenwe anyị!

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-