Publicidade

Salmos 53

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro Mahalat. Abụ maskil Devid.
Nzuzu nke ndị na-emebi iwu

1 Onye nzuzu na-asị nʼime obi ya,

"Ọ dịghị Chineke ọbụla dị."

Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ụzọ ha niile bụkwa ihe arụ;

ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe.

2 Chineke sitere nʼeluigwe

na-ele ụmụ mmadụ anya,

ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta,

onye nke na-achọ Chineke.

3 Onye ọbụla, nʼotu nʼotu ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ;

ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi,

ọ dịghị ọ bụladị otu onye.

4 Ndị niile na-eme ajọ ihe, ha amaghị ihe?

Ha na-eripịa ndị m dịka mmadụ si eri nri,

ha adịghị akpọkukwa Chineke.

5 Ma nʼebe ahụ ka ha nọ, nʼọnọdụ oke egwu,

ebe ọ dịghị ihe egwu na-adịghị.

Chineke fesasịrị ọkpụkpụ ndị niile megidere gị;

i mere ka ihere mee ha, nʼihi na Chineke ajụla ha.

6 O, a sịkwarị na nzọpụta Izrel ga-esi na Zayọn pụta!

Mgbe Chineke ga-akpọghachite ndị ya nʼọnọdụ ha,

ka Jekọb ṅụrịa ọṅụ, ka Izrel nwekwaa obi ụtọ!

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-