Publicidade

Salmos 26

Abụ Ọma Devid.
Ekpere nke ezi mmadụ

1 Onyenwe anyị, biko kpepụta m,

nʼihi na ebiela m ndụ zuruoke;

atụkwasịrị m Onyenwe anyị obi,

na-eleghị anya nʼazụ.

2 Tulee m, O Onyenwe anyị, ma nwakwaa m,

nyochaa obi m na echiche m.

3 Nʼihi na ejirila m ịhụnanya gị mere ihe nlere anya nye onwe m.

Ana m ejegharịkwa nʼime eziokwu gị.

4 Mụ na ndị na-aghọ aghụghọ adịghị enwe mmekọ ọbụla.

Otu a kwa, nnwekọ ọbụla adịghịkwa nʼetiti mụ na ndị ihu abụọ.

5 Akpọrọ m otu ndị na-emebi iwu asị.

Mụ na ndị ajọ omume agaghị anọkọkwa.

6 Ana m asacha aka m abụọ nʼọnọdụ emeghị ihe ọjọọ,

na-eje ozi nʼebe ịchụ aja gị ife gị ofufe, o Onyenwe anyị.

7 Ana m abụkwa abụ ekele,

jiri iti mkpu na-ekwusa otuto gị, na ọrụ ebube gị niile.

8 O Onyenwe anyị, ahụrụ m ụlọ obibi gị nʼanya,

ụlọ ahụ ebe ebube gị na-adịgide nʼime ya.

9 Ebibikọtala mụ na ndị mmehie,

ewezugakọtala ndụ m na nke ndị na-awụfu ọbara,

10 ndị aka ha jupụtara nʼatụmatụ ọjọọ,

aka nri ha jupụtakwara na ngarị.

11 Ma mụ onwe m na-ebi ndụ zuruoke;

gbapụta m ma meere m ebere.

12 Ụkwụ m na-eguzo nʼala dị larịị;

aga m eto Onyenwe anyị nʼetiti ọha mmadụ.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-