Publicidade

Salmos 32

Abụ Ọma Devid. Abụ Maskil.
Nkwupụta na mgbaghara mmehie

1 Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ,

onye a gbaghaara ajọ omume ya niile,

onye e kpuchikwaara mmehie ya niile.

2 Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ,

onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya,

onye ahụ nke aghụghọ ọbụla na-adịghịkwa nʼime mmụọ ya.

3 Mgbe m gbachiri nkịtị,

ọkpụkpụ m rere ure

site nʼịsụ ude m ogologo ụbọchị niile.

4 Ehihie niile na abalị niile,

ị tara m ahụhụ,

ume dị m nʼobi gwụchara,

dịka mgbe okpomọkụ nke ọkọchị. Sela

5 Mgbe ahụ, ekwupụtara m mmehie m niile nʼihu gị,

kwụsịkwa izo ha ezo.

Agwara m onwe m okwu sị,

"Aga m ekwupụta mmehie m niile nʼihu Onyenwe anyị."

Ị gbaghakwaara m

ikpe ọmụma nke mmehie m niile. Sela

6 Ya mere, ka ndị niile bụ ndị ezi omume kpọkuo gị nʼekpere

mgbe e nwere ike ịchọta gị;

nʼụzọ dị otu a, ọ bụrụ na uju mmiri abịa,

ọ gaghị erute ha.

7 Gị onwe gị bụụrụ m ebe nzuzo;

Ị ga-echebekwa m ka nsogbu ọbụla hapụ irute m nso.

Ọ bụkwa abụ nzọpụta ka i ji gbaa m gburugburu. Sela

8 Aga m eme ka ị nwee uche, zikwa gị ụzọ i kwesiri ịgbaso;

Aga m adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa nʼahụ gị.

9 Adịkwala ka ịnyịnya maọbụ ịnyịnya ibu

nke na-enweghị akọnuche,

nke a na-aghaghị iji mkpụmkpụ igwe na eriri kechie ọnụ ya, ijide ya,

ma emeghị otu a, ọ gaghị abịakwute gị.

10 Ọtụtụ ihe mgbu na-abịakwasị ndị na-eme ihe ọjọọ,

ma ịhụnanya Onyenwe anyị nke na-enweghị ọgwụgwụ,

na-agba onye ahụ tụkwasịrị ya obi gburugburu.

11 Ṅụrianụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, nweekwanụ obi ụtọ, unu ndị ezi omume;

bụọ abụ, unu ndị obi ha ziri ezi.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-