Publicidade

Salmos 54

Abụ Ọma Devid. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ maskil Devid. Mgbe ndị Zif gara sị Sọl, "Devid ọ dịghị ezo nʼetiti anyị?"
Ekpere maka nchebe

1 O Chineke, jiri aha gị zọpụta m;

jirikwa ike gị kpepụta m.

2 O Chineke, nụrụ ekpere m;

gee ntị nʼokwu ọnụ m.

3 Ndị m na-amaghị na-ebuso m agha;

ndị na-eme ihe ike na-achọ ịnapụ m ndụ m,

ndị na-akpọghị Chineke ihe ọbụla. Sela

4 Nʼezie, Chineke bụ onye inyeaka m;

onyenwe m bụ onye na-agba m ume.

5 Mee ka ihe ọjọọ lọghachikwute ndị na-ekwulu m;

nʼime ikwesi ntụkwasị obi gị, laa ha nʼiyi.

6 Aga m eji onyinye afọ ofufu chụọrọ gị aja;

O Onyenwe anyị, aga m eto aha gị, nʼihi na ọ dị mma.

7 Nʼihi na ọ gbapụtala m site na nsogbu m niile,

ọ bụ anya mmeri ka m ji na-ele ndị iro m anya.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-