Publicidade

Salmos 44

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ maskil nke ụmụ Kora.
Ekpere maka mgbapụta

1 O Chineke, anyị anụla;

nna anyị ha agwakwala anyị

ihe ndị i mere nʼoge ha,

nʼoge gara aga.

2 I ji aka gị chụpụ ndị mba ọzọ,

ma kụnye nna nna anyị ha dịka osisi.

I gwepịara ndị ahụ

ma mee ka ndị nna anyị na-eto na-awasa.

3 Ọ bụghị site na mma agha ha ka ha ji merie nweta ala a,

ha emerighị site nʼike nke aka ha;

ọ bụ aka nri gị, aka gị,

na ìhè nke ihu gị nyere ha mmeri, nʼihi na ị hụrụ ha nʼanya.

4 Ị bụ eze m na Chineke m,

onye na-ekpebi na Jekọb aghaghị inwe mmeri.

5 Nʼihi ọ bụ naanị site nʼike gị, ya na aha gị,

ka anyị ji zọda ndị iro anyị nʼokpuru ụkwụ anyị.

6 Atụkwasịghị m obi m nʼụta m,

mma agha m anaghị enye m mmeri;

7 ma i na-enye anyị mmeri nʼebe ndị iro anyị nọ,

ị na-eme ka ihere mee ndị na-eguzogide anyị.

8 Nʼime Chineke ka ịnya isi anyị dị ogologo ụbọchị niile,

anyị ga-eto aha gị ruo mgbe ebighị ebi. Sela

9 Ma ugbu a, ị jụla anyị ma weda anyị nʼala;

ị naghị esokwa ndị agha anyị apụ ọzọ.

10 I mere ka anyị site nʼihu ndị iro anyị gbalaga,

i meela ka ndị na-emegide anyị were aka ike napụ anyị ihe bụ nke anyị.

11 Ị gbakụtara anyị azụ ka e ripịa anyị dịka atụrụ,

ma chụsasịa anyị nʼetiti mba niile.

12 I rere ndị gị ọnụ ala,

ihe i retara ha abaghị uru nye gị.

13 I meela ka anyị bụrụ nkọcha nye ndị agbataobi anyị,

anyị bụ ihe ịkwa emo na ihe ọchị nye ndị gbara anyị gburugburu.

14 I meela anyị ka anyị bụrụ ihe ịmaatụ ọchị nʼetiti mba niile,

ndị ọbụla hụrụ anyị na-efufe isi na mkparị.

15 Ogologo ụbọchị niile, ihere m dị m nʼihu,

ihere m na-ekpuchikwa m ihu,

16 mgbe ndị nkwulu na ndị nkọcha na-eji m eme ihe ọchị,

nʼihi onye iro, onye kpebiri ịbọ ọbọ.

17 Ọ bụ ezie na ihe ndị a adakwasịla anyị,

ma anyị echefubeghị gị.

Anyị enupubeghị isi nʼọgbụgba ndụ anyị na gị.

18 Obi anyị ahapụbeghị gị!

Anyị ahapụbekwaghị iso ụzọ gị.

19 Ma i gwepịara anyị mee ka anyị bụrụ ebe nkịta ọhịa na-akpagharị,

jirikwa oke ọchịchịrị kpuchie anyị.

20 Ọ bụrụ na anyị chefuru aha Chineke anyị,

maọbụ na anyị gbasaara chi mba ọzọ aka anyị,

21 ọ bụ na Chineke agaraghị achọpụta ya,

ebe ọ maara ihe nzuzo niile dị nʼobi?

22 Ọ bụ nʼihi gị ka anyị na ọnwụ ji agba mgba, ogologo ụbọchị niile.

A na-ele anyị anya dịka atụrụ a gaje igbu egbu.

23 O, Onyenwe m teta! Gịnị mere i ji arahụ ụra?

Kpọtee onwe gị! Ajụkwala anyị ruo mgbe ebighị ebi.

24 Gịnị mere i ji ezopụ ihu gị,

ma chefuo mmegbu na ịta ahụhụ anyị?

25 E tidala anyị nʼala, nʼuzuzu,

ahụ anyị rapara nʼaja

26 Bilie ma nyere anyị aka;

gbapụta anyị maka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-