Publicidade

Salmos 133

Abụ nrigo, nke Devid.
Ngọzị nke ibi nʼotu

1 Lee ka o si bụrụ ihe dị mma

na ihe ọṅụ mgbe ụmụnne na-ebikọ nʼotu!

2 Ọ dị ka mmanụ dị oke ọnụahịa a wụrụ nʼisi,

nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ,

e, nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ Erọn,

ruokwa nʼolu uwe mwụda ya.

3 Ọ dị ka a ga-asị na igirigi si na Hemon

na-ada nʼelu nʼugwu Zayọn.

Nʼihi na nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị na-enye onyinye ngọzị ya,

ọ bụladị ndụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-