Publicidade

Salmos 58

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ "E bibikwala." Abụ Devid. Abụ miktam.
Ahụhụ nke ndị na-emebi iwu

1 Unu ndị na-achị achị, O nweela oge unu na-ekwu ihe ziri ezi?

O nweela oge unu na-ekpe ikpe ziri ezi nʼetiti mmadụ?

2 Mba, nʼime obi unu, unu na-echepụta mmegbu,

aka unu na-emepụta ihe ike nʼelu ụwa.

3 Ọ bụladị site nʼọmụmụ, ndị ajọ omume na-akpafu;

site nʼime afọ, ha na-akpafu akpafu na-ekwusa okwu ụgha.

4 Ha na-agbọpụta nsi nʼọnụ ha dịka agwọ,

na-emechi ntị ha dịka ajụala ntị chiri,

5 nke na-adịghị anụ olu onye mgbaasị na-akpọpụta ya,

nʼagbanyeghị otu ǹka onye ahụ si dị.

6 O Chineke, tijie eze niile dị ha nʼọnụ;

o Onyenwe anyị, dọpụta eze ọdụm ndị a!

7 Mee ka ha sọfuo dịka mmiri na-asọ asọ;

mgbe ha na-eseti ụta ha, mee ka ọnụ àkụ ha gbajie.

8 Dịka ejula nke na-agbaze mgbe ọ na-aga nʼụzọ ya;

dịka nwa nwụrụ nʼafọ nne ya, ka ha ghara ịhụ anyanwụ.

9 Tupu ite unu amata okpomọkụ nke osisi ogwu,

ma ha dị ndụ, ma ha kpọnwụrụ akpọnwụ, a ga-azachapụ ndị ajọ omume.

10 Ndị ezi omume ga-enwe obi ụtọ mgbe a bọọrọ ha ọbọ,

mgbe ha ga-asacha ụkwụ ha nʼime ọbara ndị ajọ omume.

11 Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ekwu sị,

"Nʼezie, a na-akwụghachi ndị ezi omume ụgwọ;

nʼezie, e nwere Chineke onye na-ekpe ụwa ikpe."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-