Pular para o conteúdo
Publicidade

Abụ Ọma 87

Abụ Ọma ụmụ Kora. Otu Abụ.

Abụ maka Zayọn

1 Chineke atọọla ntọala ya nʼelu ugwu nsọ ahụ;

2 Onyenwe anyị hụrụ ọnụ ụzọ ama Zayọn nʼanya,

karịa ebe obibi niile nke Jekọb.

3 Ihe dị iche iche nke dị ebube ka a na-ekwu banyere gị,

O obodo Chineke; Sela

4 "Aga m agụnye Rehab na Babilọn,

dịka ndị na-asọpụrụ m,

aga m agụnyekwa ndị Filistia, na ndị Taịa, na ndị Kush,

aga m asị, A mụrụ nke a na Zayọn.’ "

5 Nʼezie, a ga-ekwu okwu banyere Zayọn sị,

"A mụrụ nke a na nke ọzọ nʼime ya,

ya onwe ya, bụ Onye kachasị ihe niile elu, ga-eme ka o guzosie ike."

6 Onyenwe anyị ga-ede nʼime akwụkwọ usoro nke ndị mmadụ:

"A mụrụ onye a na Zayọn."

7 Dịka ha na-eti egwu, ha ga-abụ abụ sị,

"Isi iyi m niile dị na gị."

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também