Publicidade

Salmos 91

Chineke onye na-echebe anyị

1 Onye ahụ na-ebi nʼebe mgbaba Onye kachasị ihe niile elu

ga-ezu ike nʼokpuru ndo Onye pụrụ ime ihe niile.

2 Nke a ka m ga-ekwu maka Onyenwe anyị, "Ọ bụ ebe mgbaba m na ebe nchebe m e wusiri ike,

Chineke m, onye m na-atụkwasị obi m."

3 Nʼezie, ọ ga-anapụta gị

site nʼọnya nke onye osi ọnya

na site nʼaka ajọ ọrịa na-efe efe na-eweta ịla nʼiyi.

4 Ọ ga-eji nku ya kpuchie gị.

Ọ bụkwa nʼokpuru nku ya abụọ, ka ị ga-agbaba zere ndụ,

ikwesi ntụkwasị obi ya ga-echebe gị, ghọkwaara gị ọta.

5 Ị gaghị atụ egwu ihe ịtụ oke egwu nke abalị,

maọbụ àkụ na-efegharị nʼehihie,

6 maọbụ ajọ ọrịa na-efe efe, nke na-ejegharị nʼọchịchịrị,

ma ọ bụkwanụ ihe mbibi mberede na-eme nʼehihie.

7 Puku mmadụ pụrụ ịda nʼakụkụ gị,

iri puku mmadụ nwekwara ike ịda nʼakụkụ aka nri gị,

ma ihe ọjọọ ndị a agaghị erute gị nso.

8 Ọ bụ naanị anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ

ntaramahụhụ nke ndị ajọ omume.

9 Ọ bụrụ na i mee Onye kachasị ihe niile elu ebe obibi gị,

ọ bụladị Onyenwe anyị, onye bụ ebe mgbaba m,

10 mgbe ahụ, ihe ọjọọ ọbụla enweghị ike ịdakwasị gị;

ihe ike ọbụla enweghị ike ịbịaru ụlọ obibi gị nso.

11 Nʼihi na ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị,

ka ha chebe gị nʼụzọ gị niile.

12 Ha ga-eji ọbụ aka ha,

bulie gị elu ime ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.

13 Ị ga-azọkwasị ọdụm na ajụala ụkwụ,

zọgbukwaa ọdụm na-akpa ike, na agwọ ọjọọ.

14 "Nʼihi na ọ hụrụ m nʼanya, Mụ onwe m ga-agbapụta ya, ka Onyenwe anyị kwuru;

aga m echebe ya, nʼihi na ọ maara aha m.

15 Ọ ga-akpọku m, aga m azakwa ya.

Aga m anọnyere ya nʼime nsogbu ya,

aga m adọpụta, ma sọpụrụkwa ya.

16 Aga m eji ogologo ndụ mee ka afọ ju ya,

gosikwa ya nzọpụta m."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-