Publicidade

Salmos 64

Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid.
Ekpere maka nchekwa

1 Nụrụ olu m O Chineke, mgbe m na-akọsara gị ihe na-esogbu m.

Chebe ndụ m site nʼaka ndị iro m.

2 Zopu m pụọ nʼizu nzuzo niile nke ndị ọjọọ,

site nʼatụmatụ ndị na-eme ajọ ihe.

3 Ha na-amụ ire ha dịka e si amụ mma agha,

na-agbapụ okwu dịka àkụ ọjọọ.

4 Ha na-agba onye na-enweghị ihe o mere àkụ site nʼebe nzuzo,

na mberede ka ha na-agba ya, na-atụghị egwu.

5 Ha na-agbarịta ibe ha ume na-atụmatụ ọjọọ,

ha na-ekwu banyere isi ọnya ha na nzuzo,

ha na-asị, "Onye ga-ahụ ya?"

6 Ha na-atụpụta atụmatụ ọjọọ na-asị,

"Anyị echepụtala atụmatụ zuruoke!"

Nʼezie, uche na obi mmadụ dị aghụghọ.

7 Ma Chineke ga-agba ha àkụ,

na mberede ka a ga-etida ha.

8 Ọ ga-atụgharị okwu ọnụ ha megide ha,

mee ka ha laa nʼiyi;

ndị niile hụrụ ha ga-efufe isi ha nʼịkwa emo.

9 Mmadụ niile ga-atụ egwu,

ha ga-ekwupụta ọrụ niile nke Chineke,

ma tụgharịa uche nke ọma banyere ihe o mere.

10 Ndị ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị,

ha ga-agbabakwa nʼime ya;

ndị niile obi ha ziri ezi ga-anyakwa isi nʼime ya.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-