Publicidade

Salmos 25

Abụ Ọma Devid.
Ekpere maka odudu na nnapụta

1 Ọ bụ na gị Onyenwe anyị

ka m tụkwasịrị obi m.

2 O Chineke m, ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi m.

Ekwela ka ihere mee m,

ekwekwala ka ndị iro m merie m.

3 Ihere agaghị eme

onye ọbụla olileanya ya dị na gị,

ma ihere ga-eme ha

bụ ndị niile ịghọ aghụghọ jụrụ ahụ.

4 O Onyenwe anyị, zi m ụzọ gị niile,

kuzikwaara m ụzọ gị niile.

5 Duo m nʼeziokwu gị, kuzikwaara m ihe,

nʼihi na ị bụ Chineke, onye Nzọpụta m, ụbọchị niile,

olileanya m dị na gị.

6 Cheta, Onyenwe anyị, oke obi ebere na ịhụnanya gị,

nʼihi na ha na-adị siterị na mgbe ochie.

7 Echetala mmehie m mere nʼokorobịa m,

ya na nnupu isi m niile.

Kama site nʼịhụnanya gị cheta m,

Onyenwe anyị, nʼihi na onye dị mma ka ị bụ.

8 Onye dị mma na onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ;

ọ bụ ya mere ọ na-ezi ndị mmehie ụzọ ya.

9 Ọ na-edu ndị dị umeala nʼobi nʼụzọ ziri ezi,

na-ezikwa ha ụzọ nke ya.

10 Ụzọ niile nke Onyenwe anyị jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi,

nye ndị niile na-edebe iwu ọgbụgba ndụ ya.

11 Nʼihi aha gị, O Onyenwe anyị,

gbaghara m ajọ omume m nʼagbanyeghị na ha dị ukwuu.

12 Olee mmadụ ahụ nke na-atụ egwu Onyenwe anyị?

O ga-ezi ya ihe nʼụzọ ahụ a họpụtaara ya.

13 Ọ ga-ebi ogologo ụbọchị nke ndụ ya nʼime ịba ụba,

ndị agbụrụ ha ga-eketa ala ahụ.

14 Onyenwe anyị na-eme ka ndị ahụ na-atụ egwu ya mara

ọgbụgba ndụ ya na izu nzuzo ya.

15 Anya m abụọ na-elegide Onyenwe anyị mgbe niile;

nʼihi na ọ bụ naanị ya ga-eme ka ụkwụ m abụọ site nʼọnya pụta.

16 Chee m ihu ma gosi m ebere gị,

nʼihi na abụ m onye nọ na nsogbu, naanị m nọkwa.

17 Ihe mgbu nke obi m abaala ụba,

napụta m site nʼobi mwute.

18 Lekwasị nsogbu m na ihe mgbu m anya.

Biko, gbaghara m mmehie m niile.

19 Lee ka ndị iro m si mụbaa,

ha ji oke iwe kpọọ m asị.

20 Chebe ndụ m ma gbapụta m;

ekwela ka m bụrụ onye ihere ga-eme,

nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ

21 Kwere ka ezi omume na izuoke bụrụ ihe ga-agba m gburugburu,

nʼihi na olileanya m dị nʼime gị.

22 O Chineke, Gbapụtakwa Izrel,

site na nsogbu ya niile.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-