Publicidade

Salmos 130

Abụ nrigo.
Mkpụrụobi na-ele anya Chineke

1 O Onyenwe anyị, ọ bụ site nʼebe dị omimi ka m na-ebeku gị akwa.

2 Onyenwe anyị, nụrụ olu m.

Ka ntị gị na-aṅakwa ntị

nʼolu arịrịọ m, maka amara.

3 O Onyenwe anyị, a sị na i detuo mmehie niile,

Onyenwe anyị, onye pụrụ iguzo?

4 Ma ọ bụ nʼaka gị ka mgbaghara mmehie dị;

ime ka anyị tụọ gị egwu, ma jeere gị ozi.

5 Ana m echere Onyenwe anyị, mkpụrụobi m na-echekwa ya,

ọ bụ nʼokwu ya ka olileanya m dị.

6 Mkpụrụobi m na-echere Onyenwe anyị

karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ,

e, karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ.

7 Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị,

nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide adịgide,

nʼaka ya ka nzọpụta zuruoke dịkwa.

8 Ya onwe ya, ga-agbapụta Izrel

site na mmehie ya niile.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-