Pular para o conteúdo
Publicidade

Abụ Ọma 129

Abụ nrigo.

Ekpere megide ndị iro Izrel

1 Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge,

ka Izrel kwuo.

2 "Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge,

ma ha enweghị ike merie m.

3 Ndị ikom na-akọ ubi akọgharịala azụ m dịka ala ubi,

mee ebe ha kọrọ akọ ka dị ogologo.

4 Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume;

tọpụla m site nʼagbụ niile nke ndị ajọ omume."

5 Ka ndị niile kpọrọ Zayọn asị

bụrụ ndị ga-alaghachi azụ nʼihere.

6 Ka ha niile dịrị ka ahịhịa na-epu nʼelu ụlọ

nke na-akpọnwụ tupu o pupụta;129:6 Ọ bụ ụrọ a gwakọtara ntụ na aja ka e ji emechi elu ụlọ nʼIzrel. Nʼoge mmiri ozuzo, ahịhịa na-epu nʼelu ụlọ ndị a nʼihi na ha dị larịị, ma ha adịghị adịgide. Mgbe ọkọchị bịara, nʼihi na mgbọrọgwụ ha abanyeghị nʼime aja elu ụlọ ndị a, ha na-akpọnwụ Abụ 37:2

7 nke onye na-ewe ihe ubi na-adịghị eji ha kpojuo aka ya abụọ,

maọbụ onye mkpokọta e nwee ike kpojuo aka ya.

8 Ka ndị si nʼụzọ na-agafe hapụ sị ha,

"Ngọzị Onyenwe anyị dịrị unu.

Anyị na-agọzi unu nʼaha Onyenwe anyị."129:8 Rut 2:4

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também