Publicidade

Salmos 129

Abụ nrigo.
Ekpere megide ndị iro Izrel

1 Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge,

ka Izrel kwuo.

2 "Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge,

ma ha enweghị ike merie m.

3 Ndị ikom na-akọ ubi akọgharịala azụ m dịka ala ubi,

mee ebe ha kọrọ akọ ka ọ dị ogologo.

4 Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume;

ọ tọpụla m site nʼagbụ niile nke ndị ajọ omume."

5 Ka ndị niile kpọrọ Zayọn asị

bụrụ ndị ga-alaghachi azụ nʼihere.

6 Ka ha niile dịrị ka ahịhịa na-epu nʼelu ụlọ

nke na-akpọnwụ tupu o pupụta;

7 nke onye na-ewe ihe ubi na-adịghị eji ha kpojuo aka ya abụọ,

maọbụ onye mkpokọta e nwee ike kpojuo aka ya.

8 Ka ndị si nʼụzọ na-agafe hapụ ị sị ha,

"Ngọzị Onyenwe anyị dịrị unu.

Anyị na-agọzi unu nʼaha Onyenwe anyị."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_06-50-08-