Publicidade

Salmos 42

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Maskil nke ụmụ Kora.
Iru ụjụ na nkasiobi onye ezi omume

1 Dịka agụụ ịṅụ mmiri si na-agụ nne ele,

otu a ka agụụ ihe banyere gị si na-agụ m, O Chineke.

2 Akpịrị nke ihe banyere Chineke, bụ Chineke ahụ dị ndụ, na-akpọ m nkụ.

Olee mgbe m pụrụ ịga zute Chineke?

3 Anya mmiri m aghọọlara m ihe oriri

nʼehihie ma nʼabalị,

mgbe ndị mmadụ na-asị m ogologo ụbọchị niile,

"Olee ebe Chineke gị nọ?"

4 Ihe ndị a ka m na-echeta

mgbe m na-ekwupụta ihe mgbu nke obi m:

ma m cheta mgbe mụ na igwe mmadụ so aga,

mgbe m ji iti mkpu ọṅụ na ekele na-edu ha

nʼetiti ọha kachasị ibe ya, ndị ọṅụ juru obi,

na-aga nʼụlọ Chineke.

5 O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba?

Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m?

Nwee olileanya na Chineke,

nʼihi na m ka ga-eto ya,

Onye nzọpụta m na Chineke m.

6 Mkpụrụobi m na-ada mba nʼime m;

ya mere, aga m echeta gị

site nʼala Jọdan,

na ebe dị elu nke Hemon, na sitekwa nʼugwu Miza.

7 Ogbu mmiri na-akpọku ogbu mmiri

mgbe olu ha na-ada ụda nʼetiti nruda mmiri gị niile;

ebili mmiri gị niile na mmali mmiri gị niile

ekpuchiela isi m.

8 Nʼehihie, Onyenwe anyị na-awụkwasị m ịhụnanya ya,

nʼabalị abụ ya dị m nʼobi,

ekpere nye Chineke nke ndụ m.

9 Ana m asị Chineke, oke nkume m,

"Gịnị mere i ji chefuo m?

Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụ

nʼihi mmegbu nke onye iro?"

10 Ọkpụkpụ m na-agabiga oke ihe mgbu,

mgbe ndị iro m ji m na-eme ihe ọchị,

ogologo ụbọchị niile ha na-ajụ m,

"Olee ebe Chineke gị nọ?"

11 O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba?

Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m?

Nwee olileanya na Chineke,

nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ,

Onye nzọpụta m na Chineke m.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-